Daniel 7:27 - Bible Nso27 Ma ala-eze ahu, na ọchichi ahu, na idi-uku nke ala-eze nile n'okpuru elu-igwe nile, ka agēnye ndi ahu, bú ndi nsọ nke Onye ahu nke kachasi ihe nile elu: ala-eze-Ya bu ala-eze ebighi-ebi, ọchichi nile gēfè kwa Ya, nu olu-Ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a27 Mgbe ahụ, ike ọchịchị, ike na ịdị ukwuu nke alaeze niile dị nʼokpuru eluigwe ka a ga-enyefe nʼaka ndị nsọ, bụ ndị nke Onye ahụ kachasị ihe niile elu. Alaeze ya ga-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi. Ndị niile na-achị achị ga-erubere ya isi, kpọọkwa isiala nye ya.’ Faic an caibideil |
Ma n'ọgwugwu ubọchi ahu nile mu onwem, bú Nebukadneza, weliri anyam abua lekwasi elu-igwe, ihe-ọmumam we laghachikutem, ọ bu kwa Onye ahu nke kachasi ihe nile elu ka m'gọziri, ọ bu kwa Onye ahu nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi ka m'jara sọpuru kwa, Onye ọchichi-Ya bu ọchichi ebighi-ebi, ala-eze-Ya nādigide kwa n'ọb͕ọ nile:
M'we hu oche-eze, ha we nọkwasi ha, we nye ha ikpé: m'we hu nkpuru-obi nke ndi ebipururi isi n'ihi àmà Jisus, na n'ihi okwu Chineke, ndi ahu nọ kwa, bú ndi nākpọghi isi ala nye anu-ọhia ahu, ma-ọbu ihe-oyiyi-ya, ndi nānataghi kwa akàrà-ya n'egedege-iru-ha na n'aka-ha; ha we di ndu, so kwa Kraist buru eze nnù arọ abua na ọgu iri.