Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 7:2 - Bible Nso

2 Daniel zara, si, Anọm nāhu n'ọhùm n'abali, ma, le, ifufe anọ nke elu-igwe nēfekwasi oké osimiri uku si-ike.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Mụ bụ Daniel hụrụ nʼime ọhụ m nʼabalị, elere m anya, hụ nʼihu m oke ifufe anọ nke eluigwe ka ha na-atụgharị oke osimiri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 7:2
13 Iomraidhean Croise  

Ahuhu! ọ bu ùzù ọtutu ndi, dika ùzù nke oké osimiri ka ha nātu ùzù; ọ bu kwa nkpọtu nke mba di iche iche, dika nkpọtu nke ọtutu miri ka ha nākpọtu.


M'gēme kwa ka ifufe anọ si na nsọtu anọ nke elu-igwe biakute Ilam, M'gēfesa kwa ha nye ifufe nile ndia; ọ gaghi-adi kwa mba ọ bula ebe ndi Ilam achugara achuga nāgaghi-abà.


Oké osimiri erukpuwo Babilon: ejiwo nkpọtu nmali-miri-ya nile kpuchie ya.


Ma mb͕e o guzoro ọtọ, agētipia ala-eze-ya, kesa ya na nchere-iru ifufe anọ nke elu-igwe; ma ọ gaghi-adiri umu-ya gānọchi ya, ọ gaghi-adi kwa ka ala-ọchichi-ya nke ọ chiri si di; n'ihi na agēropu ala-eze-ya, ọ gādi-kwa-ra ndi ọzọ nābughi ndia.


Mb͕e ahu Daniel ka ekpughere ihe-nzuzo ahu nye n'ọhù nke abali. Mb͕e ahu Daniel gọziri Chineke nke elu-igwe.


Anọm nāhu n'ọhù nile nke abali, ma, le, otù onye, nke di ka nwa nke madu, nọ nābia n'igwe-oji nke elu-igwe, ọ bu kwa Onye ochie ahu ka ọ biakutere, ha we me ka ọ biarue nso n'iru Ya.


Mb͕e nka gasiri m'nọ nāhu n'ọhù nile nke abali, ma le, otù anu, nke mere ha anọ, nke di egwu, nwe ume, dikarisiri ike; ọ nwe-kwa-ra ezé di uku nke ígwè: o ripiara ihe tapia kwa, ma nke fọduru, o jiri ukwu-ya zọtọ ya: anu ahu di kwa iche n'anu nile buru ya uzọ; o nwe-kwa-ra mpi iri.


M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.


Nkpi ahu we me onwe-ya uku ri nne: ma mb͕e o nwere ume, ab͕ajiri mpi uku ya; mpi anọ nke juru anya n'olile we pute n'ọnọdu ya chere iru n'ifufe anọ nke elu-igwe.


Mọ-ozi ahu we za, sim, Ndia bu ifufe anọ nke elu-igwe, ndi nēsi n'iguzo onwe-ha n'iru Onye-nwe uwa nka nile pua.


Ọ gēwere kwa opì uku zipu ndi-mọ-ozi-Ya, ha gēme kwa ka ndi nke Ya arọputara si n'ifufe anọ zukọ, site n'otù nsọtu elu-igwe rue nsọtu-ya ọzọ.


O we sim, Miri nile i huru, ebe nwanyi ahu onye nākwa iko nānọdu, bu ndi di iche iche, na ìgwè madu, na mba di iche iche, na asusu di iche iche.


Mb͕e nka gasiri m'we hu ndi-mọ-ozi anọ ka ha nēguzo n'elu nkuku anọ nke uwa, nējidesi ifufe anọ nke uwa ike, ka ifufe ọ bula we ghara ife n'elu uwa, ma-ọbu n'elu oké osimiri, ma-ọbu n'elu osisi ọ bula.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan