N'aka madu site n'aka-Gi, Jehova, N'aka madu nke uwa, ndi òkè-ha bu na ndu a, Ndi I nēmeju afọ-ha n'ihe-Gi atukọbara atukọba: Afọ nēju ha n'umu, Ha we rapuru umu-ntakiri-ha ihe-ha fọduru.
Abiarurum nso otù onye nime ndi ahu nēguzo ọtọ n'ebe ahu, ọ bu kwa ihe bu ezi okwu bayere ihe a nile ka m'riọrọ n'aka ya. O we gwam okwu, ọ bu kwa isi ọhù ndia ka o mere ka m'mara, si:
Jisus zara, si, Ala-ezem esiteghi n'uwa nka: ọ buru na ala-ezem sitere n'uwa nka, ndi nējerem ozi gālu ọ̀gù, ka aghara iraram nye n'aka ndi-Ju: ma ub͕u a ala-ezem esighi n'ebe a puta.
o we guzọ n'ájá oké osimiri. M'we hu anu-ọhia ka ọ nēsi n'oké osimiri rigoputa, nēnwe mpi iri na isi asa, nēkpu kwa okpu-eze iri n'elu mpi-ya, nēnwe kwa aha ufọdu nke nkwulu Chineke n'elu isi-ya.