Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 7:15 - Bible Nso

15 Ma mu onwem, bú Daniel, o wutara mọm nime ọbọ́-ya, ọhù nile nke isim nēme kwa ka m'ma jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

15 “Mụ onwe m, bụ Daniel, ọhụ a m hụrụ tụrụ mmụọ m ụjọ nke ukwuu, mekwa ka obi m ma jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 7:15
18 Iomraidhean Croise  

O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.


Ma mu onwem, anukpọghm ipu n'iso Gi n'izù aturu; ọzọ, ubọchi nādighi ngwọta, achọsighm ya ike; Gi onwe-gi mara: ihe si n'eb͕ub͕ere-ọnum puta, na ncherita-iru Gi ka ọ diworo.


Ma, le, otù onye nke di ka oyiyi umu nke madu nēmetu eb͕ub͕ere-ọnum abua aka: m'we saghe ọnum, kwue okwu, si onye ahu nke nēguzo na ncherita-irum, Onye-nwem, site n'ọhù a aru-ufum nile dakwasirim na mberede, m'we ghara inagide ike ọ bula.


Ma n'arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche; mọ-ya we basasia, ura-ya we gwu n'anya-ya.


Eze we si ha, Nrọ ka m'rọworo, mọm we b͕asasia imara nrọ ahu.


Mb͕e ahu o juru Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, anya nwa mb͕e, èchìchè-ya nile we me ka ọ ma jijiji. Eze zara, si, Belteshaza, ekwela ka nrọ a ma-ọbu akukọ-isi-ya me ka i ma jijiji. Belteshaza zara, si, Onye-nwem, ka nrọ a diri ndi nākpọ gi asì, ka akukọ-isi-ya di-kwa-ra ndi-iro-gi.


Nrọ ka m'huru, o we me ka m'tua egwu; èchìchè nile m'nēchè n'elu ihe-ndinam na ọhù nile nke isim we me ka m'ma jijiji.


N'arọ mbu nke Belshaza, bú eze Babilon, Daniel huru nrọ na ọhù di iche iche nke isi-ya n'elu ihe-ndina-ya: mb͕e ahu nrọ ahu ka o dere n'akwukwọ, ọ bu isi ihe n'ihe nile ọ huru ka o kwuru.


N'ebe a ka ọgwugwu okwu a di. Ma mu onwem, bú Daniel, èchìchèm nile nēme ka m'ma jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke irum nāb͕anwe kwa n'arum: ma okwu ahu ka m'debere n'obim.


M'we hu n'ọhù ahu; o we rue, mb͕e m'nāhu, na mu onwem nọ na Shushan, bú ulo uku eze nke di n'Ilam, bú ala anāchi achi; m'we hu n'ọhù ahu, ma le, mu onwem nọ n'akuku osimiri Ulai.


Ma mu onwem, bú Daniel, ike gwurum, m'we ria ọria ubọchi ufọdu; m'we bilie, je ozi eze: ọhù ahu ju-kwa-ram anya, ma ọ dighi onye nāghọta ya.


Anurum, afọm we ma jijiji, N'olu ahu eb͕ub͕ere-ọnum abua nākukọta; Ire-ure nābà n'ọkpukpum nile, ọ bu kwa n'ọnọdum ka m'nāma jijiji: Ka m'we zue ike rue ubọchi ahuhu, Mb͕e ọ nārigota imegide ndi ahu nke nēmegide ya n'usu ndi nāpunara madu ihe.


ebe m'matara na ntupu nke ulo-ikwūm nka nābia ọsọsọ, ọbuná dika Onye-nwe-ayi Jisus Kraist gosirim.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan