9 N'ihi nka ka eze, bú Daraiọs, kayere aha-ya n'ihe ahu edere n'akwukwọ, na n'isọ-nsọ ahu.
9 Ya mere, Daraiọs jiri aka ya dee aha ya nʼakwụkwọ iwu ahụ.
Ọ buru na ọ di eze nma, ka okwu ala-eze si n'iru ya pua, ka ede kwa ya n'akwukwọ n'etiti iwu Peasia na Media, o we ghara igabiga, ka Vashti ghara ibia ọzọ n'iru eze, bú Ahasuerọs; ka eze nye kwa nwayi-ibe-ya nke ka ya nma ọnọdu-nwunye-eze-ya.
Ọ di nma ib͕abà nime Jehova Kari itukwasi ndi amara aha-ha obi.
Unu atukwasila obi n'aru ndi amara aha-ha, Ma-ọbu n'aru nwa nke madu, onye ọ nādighi nzọputa o nwere.
Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi ma gi n'ọnyà, Ejiwo okwu nile nke ọnu-gi nwude gi.
Rapunu madu, onye otù nku-ume di n'imi-ya: n'ihi na nìme gini ka aganāgu ya?