Daniel 6:8 - Bible Nso8 Ub͕u a, eze, me ka isọ-nsọ a guzosie ike, kaye aha-gi n'ihe a edere n'akwukwọ, ka ewe ghara ib͕anwe ya, dika iwu nke Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a8 Anyị chọkwara ka gị bụ eze kwagide iwu a ma jirikwa aka gị dee aha gị nʼakwụkwọ iwu ahụ. Nʼihi na anyị chọrọ ka ọ bụrụ iwu nke na-agaghị enwe mgbanwe, nke a na-apụghị ịkagbukwa akagbu, dịka iwu ndị Midia na Peshịa si dị.” Faic an caibideil |
Ewe kpọ ndi-ode-akwukwọ eze n'ọnwa mbu, n'ubọchi nke-iri-na-atọ di nime ya, ewe de ya n'akwukwọ dika ihe nile si di nke Heman nyere ndi nọchiri anya eze n'iwu, nke o nye-kwa-ra ndi nāchi ala ndi bu ndi-isi ala ọ bula anāchi achi, nke o nye-kwa-ra ndi-isi ndi ọ bula; ala ọ bula anāchi achi dika odide-akwukwọ-ya si di, na ndi ọ bula dika asusu-ya si di; n'aha eze, bú Ahasuerọs, ka edere ya, eji-kwa-ra nb͕a-aka-akàrà eze ka ya akàrà.
Mb͕e ahu ha biaruru nso, kwue okwu n'iru eze bayere isọ-nsọ eze, si: Ọ̀ dighi isọ-nsọ i kayere aha, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum? Eze zara, si, Ihe nke nēguzosi ike ka ihe a bu, dika iwu Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga.