Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 6:24 - Bible Nso

24 Eze we kwue, ha we me ka ndikom ahu bia, bú ndi borori Daniel ebubo, ọ bu kwa n'olùlù ọdum ka ha tubàra ha na umu-ha na ndi bu nwunye-ha; ha akēruteghi kwa ala olùlù ahu tutu ọdum enwe ike n'aru ha, tapia ọkpukpu-ha nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

24 Mgbe ahụ, eze nyere iwu ka e jide ndị ahụ boro Daniel ebubo. O nyere iwu ka a tụnye ha nʼolulu ọdụm ahụ, ha na ndị nwunye ha na ụmụ ha. Ọdụm ndị ahụ dị nʼime olulu ahụ jidere ndị ahụ dọrie ma ọkpụkpụ ha tupu ha adaruo ala.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 6:24
13 Iomraidhean Croise  

ma o meghi ka umu nke ndi-otib͕u-madu ahu nwua: dika nke edeworo n'akwukwọ iwu Moses si di, nke Jehova nyere n'iwu, si, Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha; kama onye ọ bula gānwu nime nmehie nke aka ya.


Ha we kwuba Heman n'elu osisi nke o doziri nye Mọdekai. Ewe me ka ọnuma eze bìe.


bú umu-ndikom iri nke Heman nwa Hamedata, bú onye nākpab͕u ndi-Ju; ma ha esetighi aka-ha n'ihe-nluta-n'agha-ha.


ma mb͕e Esta batara n'iru eze, eze ji akwukwọ si ka èchìchè ọjọ ya, nke o chère megide ndi-Ju, ka o chigharikwasi n'isi-ya; ọ si kwa ka akwuba ya na umu-ya ndikom n'elu osisi.


Ọ gēnyeghachi ndi nēchem anwu ihe ọjọ ha: Were ezi-okwu-Gi kpochapu ha.


Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu, Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya.


Agaghi-agu onye-àmà okwu-ugha n'onye nēmeghi ihe ọjọ; Ọzọ, onye nēkupu okwu-ugha dika ume gāla n'iyì.


Edozirim nkpuru-obim rue ututu; dika ọdum, otú a ka Ọ nānyaji ọkpukpum nile: Site n'ehihie rue abali I gēme ka m'gwusia.


N'ihi nka ka Jehova ji si otú a: Unu onwe-unu egeghm nti, ikpọsa, onye o bula ọ gwa nwa-nne-ya, onye ọ bula o gwa madu-ibe-ya, si ka o nwere onwe-ya: le, M'nākpọsara unu si na unu nwere onwe-unu, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), ibà na mma-agha, na ibà n'ajọ ọria nēfe efe, na ibà n'oké unwu; M'gēwere kwa unu nye iburu ala-eze nile nke uwa ihe-ntughari.


N'ihi nka, n'ihi na okwu eze di ọku ọku, na n'ihi na oké ọku ahu bu ihe emeworo ka ọ dikari ọku ókè, ọbuná ndikom ahu ka ire ọku b͕uru, bú ndi meworo ka Shedrak na Mishak na Abed-nego rigota.


Agaghi-eme ka ndi bu nna nwua n'ọnọdu umu-ha, agaghi-eme kwa ka umu nwua n'ọnọdu ndi bu nna-ha: agēme ka ha nwua, onye ọ bula nime nmehie nke aka ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan