Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 6:20 - Bible Nso

20 Mb͕e ọ nābiaru nso olùlù ahu n'ijekuru Daniel, ọ bu olu dika nke onye ihe nēwuta ka o jiri ti nkpu: eze zara, si Daniel, Daniel, gi orù nke Chineke di ndu, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ọ̀ puru idọputa gi n'aka ọdum?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Mgbe ọ bịaruru nso olulu ahụ, ọ kpọrọ Daniel oku nʼolu obi ntiwa sị, “Daniel, ohu Chineke dị ndụ, Chineke gị ahụ ị na-efe mgbe niile, o nwekwara ike ịzọpụta gị nʼaka ọdụm?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 6:20
30 Iomraidhean Croise  

Ọ̀ di ihe kariri Jehova ime? Na mb͕e akara àkà ka M'gēchigharikute gi, dika mb͕e a aka-nile, Sera gēnwe kwa nwa-nwoke.


Nāchọnu Jehova na ike-Ya; Chọnu iru-Ya mb͕e nile.


Ewezugawom obim ime ukpuru-Gi nile, Rue mb͕e ebighi-ebi, rue mb͕e ikpe-azu.


M'gēto Jehova n'ogologo ndum nile: M'gābùku Chinekem abù ọma mb͕e m'nọ nādi ndu.


Ma mu onwem nọ n'aka-Gi mb͕e nile: I jidewo aka-nrim.


Ewo, Onye-nwe-ayi Jehova! le, Gi onwe-gi emewo elu-igwe na uwa site n'ike uku Gi na site n'ogwe-aka-Gi eseteri eseti: ọ dighi ihe ọ bula kariri Gi ime:


Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m'meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà unu n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n'akam?


Asi na ọ di uzọ ọ bula Chineke ahu Onye ayi onwe-ayi nēfè puru inaputa ayi, ọ bu n'oké ọku nke nēnwu ajọ onwunwu na n'aka-gi, eze, ka Ọ gānaputa ayi.


Mb͕e ahu eze kwuru, ha we me ka Daniel bia, ha we tubà ya n'olùlù ọdum. Eze zara, si Daniel, Chineke-gi, Onye gi onwe-gi nēfè mb͕e nile, Ya onwe-ya gādọputa gi.


Mb͕e ahu eze biliri n'isi-ututu, mb͕e chi bọrọ, o we were ọsọ garue olùlù ọdum.


Anēsite n'irum nye iwu, si, n'ebe nile ọ bula anāchi n'ala-ezem, ka madu nāma jijiji nātu egwu n'iru Chineke nke Daniel: N'ihi na Ya onwe-ya bu Chineke di ndu, Ọ nēguzosi kwa ike rue mb͕e nile ebighi-ebi, ala-eze-Ya bu kwa nke anāgaghi-emebi, ọchichi-Ya gādigide kwa rue ọgwugwu ihe nile:


Ọ bu Onye-ndọputa, na Onye-nnaputa, na Onye nēme ihe-iriba-ama di iche iche na ihe-iju-anya di iche iche n'elu-igwe na n'uwa; Onye dọputaworo Daniel n'aka ọdum.


Ma gi onwe-gi, nime Chineke-gi ka i gālata: debe ebere na ikpé ziri ezi, le kwa anya Chineke-gi mb͕e dum.


Jehova we si Moses, Aka Jehova, ọ̀ ghọwo nkpunkpu aka? ub͕u a ka i gāhu ma okwum gērere gi ma-ọbu na ọ gaghi-ere.


N'ihi na ọ dighi okwu ọ bula si Chineke n'ọnu puta nke nāgaghi-adi irè.


O we turu ha ilu izí ha na ha aghaghi ikpe ekpere mb͕e nile, na ighara ikwe ka ike gwu ha;


Ma ayi onwe-ayi gānọgidesi ike n'ekpere-ayi, na n'ije ozi okwu Chineke.


ndi site na ntachi-obi n'ezi ọlu nāchọ otuto na nsọpuru na apughi-imebi ka Ọ gēnye ndu ebighi-ebi:


Onye dọputara ayi n'oké ọnwu di otú a, Ọ gādọputa kwa ayi: Onye ayi leworo anya Ya na Ọ ganādọputa kwa ayi ọzọ;


Nānọgidesinu ike n'ekpere-unu, nāmu-kwa-nu anya nime ya n'ikele-ekele;


Ọ bu kwa n'ihi ihe a ka m'nāhu kwa ahuhu ndia: ma ihere adighi-emem; n'ihi na amataram Onye m'kweworo okwu-Ya, eme-kwa-ra ka m'kweye na Ọ puru iche ihe m'nyere n'aka-Ya idebe nche rue ubọchi ahu.


O site-kwa-ra na nka pu izọputachasi ndi nēsite n'aka Ya abiakute Chineke, ebe Ọ nādi ndu mb͕e nile iriọ aririọ n'ihi ha.


Ma onye nyochaworo nime iwu zuru okè, bú iwu nke inwe-onwe-ya, nke nānọgide kwa otú a, ghara ighọ onye nānu anu nke nēchezọ, kama ọ bu onye nēme eme nke nālu ọlu, onye a gābu onye-ngọzi n'omume-ya.


Ma Onye ahu nke puru iche unu nche ka unu ghara isu ngọngọ, na iguzo unu n'iru ebube-Ya nādighi ita uta n'oké obi-utọ,


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan