Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 6:2 - Bible Nso

2 na ido ndi-isi atọ ndi-isi-ha, ndi Daniel bu otù nime ha; ka ndi ahu ndi nọchiri anya eze we nākọrọ ha akukọ ihe nile ha nēme, ka o we ghara kwa idi ihe nēfunari eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 O họpụtakwara ndịisi atọ ọzọ dịka ndịisi ha, nke otu onye nʼime ha bụ Daniel. Ndị a bụ ndị ga na-agụkọrọ ha otu ihe si aga, ka ihe ọbụla ghara ifunarị eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 6:2
14 Iomraidhean Croise  

Lezi-kwa-nu anya ka nmehie ghara idi n'ime ihe a: n'ìhi gini ka ihe ọjọ a gādi uku ime ka ihe funari ndi-eze.


n'ihi na erewo ayi, bú mu onwem na ndim, ikpochapu ayi, na ib͕u ayi, na ime ka ayi la n'iyì. Ma asi na erewo ayi ibu ndi-orù-ndikom na ibu ndinyom nēje ozi, m'gāb͕a nkiti, ọ bu ezie na onye-nkpab͕u agaghi-emezu n'ihe gēfunari eze.


Onye nēbipu ukwu onwe-ya na onye nāṅu ime-ihe-ike dika miri Ka onye ahu bu nēzi ozi site n'aka onye-nzuzu.


Ubọchi ndu di ogologo di n'aka-nri-ya; N'aka-ekpe-ya ka àkù na nsọpuru di.


Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m'mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka i gāchi achi.


Mb͕e ahu Belshaza kwuru okwu, ha we yibe Daniel uwe-ododo, yibe kwa ya iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, kwusa okwu bayere ya, si na ọ gābu onye nāchi achi dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze ahu.


Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi.


Ọ di Daraiọs nma n'anya ido ọgu madu isi, bú ndi nọchiri anya eze, ka ha buru ndi-isi ala-eze-ya, ndi gānọ n'ala-eze ahu nile;


N'ihi nka ewere ala-eze elu-igwe tuyere otù eze, onye chọrọ ka ya na ndi-orù-ya piazie.


Ọ we kpọ ya, si ya, Ọ̀ bu gini bu nka nke m'nānu bayere gi? kọrọm akukọ nke ọchichi-èzí-na-ulo-gi; n'ihi na i pughi ichi èzí-na-ulo ọzọ.


N'ebe a ihe anāchọ kwa n'aka ndi nāchi èzí-na-ulo bu, ka ahu onye ọ bula na o kwesiri ntukwasi-obi.


N'ihi nka, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova, bú Chineke Israel, puta, Ọ bu ezie na M'siri na ulo-gi na ulo nna-gi gējeghari n'irum rue mb͕e ebighi-ebi: ma ub͕u a, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, Ya burum ihe-árú; n'ihi na ndi nāsọpurum ka M'gāsọpuru, ma agākpọ ha ihe efu, bú ndi nēlelìm.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan