Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 6:14 - Bible Nso

14 Mb͕e ahu eze, mb͕e ọ nuru okwu a, ọ jọrọ njọ n'anya-ya nke-uku, ọ bu kwa Daniel ka ọ tukwasiri obi-ya idọputa ya: we rue ọdida anyanwu ka ọ nọ nējisi ike inaputa ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 Obi jọrọ eze njọ nke ukwuu mgbe ọ nụrụ ihe ndị a. O kpebiri nʼobi ya ime ihe niile ịhụ na Daniel ataghị ahụhụ. Ya mere, ụbọchị ahụ niile, site nʼụtụtụ ruo nʼanyasị, ọ nọ na-eche otu ọ ga-esi mee nke a.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 6:14
10 Iomraidhean Croise  

Site kwa na ndi Dan, bú ndi nēdo agha n'usoro, orú nnù uzọ atọ na nnù iri-na-otù na ọgu iri.


Heman we si eze, bú Ahasuerọs, Otù ndi di ndi emeworo ka ha b͕asa, ndi ekesawo-kwa-ra ha n'etiti ndi di iche iche n'ala nile anāchi achi nke ala-eze-gi; iwu nile ha di kwa iche n'iwu ndi ọ bula; ha adighi-edebe kwa iwu nile nke eze: o kwesighi kwa eze ka o kwe ka ha nọduru onwe-ha.


Ma n'etiti ha ka umu Juda ufọdu di, bú Daniel, na Hananaia, na Mishael, na Azaraia.


Ndi-Ju ufọdu di ndi i doworo ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon, ha bu Shedrak na Mishak na Abed-nego; ndikom ndia anughi olu-gi, eze: chi-gi nile ka ha nādighi-efè, ọ bu kwa onyinyo ọla-edo nke i guzobeworo ọtọ ka ha nādighi-akpọ isi ala nye.


Mb͕e ahu Nebukadneza n'oké iwe na ọnuma-ya siri ka eme Shedrak na Mishak na Abed-nego ka ha bia. Mb͕e ahu ha mere ka ndikom ndia bia n'iru eze.


O we wuta eze ahu n'obi nke-uku; ma n'ihi iṅu-iyi-ya nile, na n'ihi ndi nọduru na nri, ọ chọghi iju ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan