Daniel 5:7 - Bible Nso7 Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a7 Eze kpọrọ mkpu ka a kpọbata ndị dibịa niile na ndị Kaldịa, na ndị na-akọwa maka njegharị nke kpakpando. Mgbe ahụ eze sịrị ndị ikom amamihe nke Babilọn, “Onye ọbụla nwere ike gụọ ihe ahụ e dere, nke nwekwara ike ịkọwara m ihe ọ pụtara, ka a ga-eyikwasị uwe odo odo nke ndị eze. A ga-anyakwasị ya ihe olu ọlaedo. A ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze a.” Faic an caibideil |
otù nwoke di n'ala-eze-gi, onye mọ nke chi nsọ nile di nime ya; ọzọ, n'ubọchi nna-gi ìhè na uche na amam-ihe, dika amam-ihe nke chi nile, ka ahuru nime ya: ọzọ, eze ahu, bú Nebukadneza, bú nna-gi, onye-isi nke ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe ka o doro ya, bú nna-gi, eze;