Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 5:7 - Bible Nso

7 Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Eze kpọrọ mkpu ka a kpọbata ndị dibịa niile na ndị Kaldịa, na ndị na-akọwa maka njegharị nke kpakpando. Mgbe ahụ eze sịrị ndị ikom amamihe nke Babilọn, “Onye ọbụla nwere ike gụọ ihe ahụ e dere, nke nwekwara ike ịkọwara m ihe ọ pụtara, ka a ga-eyikwasị uwe odo odo nke ndị eze. A ga-anyakwasị ya ihe olu ọlaedo. A ga-emekwa ya ka ọ bụrụ onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze a.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 5:7
28 Iomraidhean Croise  

O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.


Mb͕e ihe ndia gasiri, eze, bú Ahasuerọs, mere Heman nwa Hamedata, bú onye Egag, ka ọ buru onye oku, o we bulie ya elu, do oche-eze-ya n'ebe di elu kari ndi-isi nile ya na ha nọ.


Fero we kpọ kwa ndi mara ihe, kpọ kwa ndi-mb͕asi: ha onwe-ha kwa, bú ndi-ode-akwukwọ di nsọ nke Ijipt, we were ihe-nzuzo di iche iche ha me otú a.


N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi, Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.


Ntì-gi abua mara nma n'agiri-isi akpara akpa, Olu-gi mara nma n'ihe di oké ọnu-ahia agara aga.


Ike agwuwo gi n'ọtutu ndum-ọdu-gi: biko, ka ha guzo ọtọ, we zọputa gi, bú ndi nēkè elu-igwe, ndi nēlegide kpakpando, ndi nēme ka amara kwa-ọnwa ihe gēme, n'ihe gābiakwasi gi.


Mma-agha di n'aru ndi Kaldea, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na n'ebe ndi bi na Babilon nọ, na n'ebe ndi-isi-ya nọ, na n'ebe ndi-ya mara ihe nọ.


M'we ke gi ihe-ichọ-nma, tiye ọla-aka n'aka-gi abua, na iyab͕a n'olu-gi.


Ma n'okwu ọ bula nke amam-ihe nke nghọta, nke eze chọrọ n'aka ha, ọ huru na ha ka ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile na ndi-dibia nile ndi nọ n'ala-eze-ya nile nma ub͕ò iri.


bú umu-okoro nke ọ dighi ọlu ọ bula di ha n'aru, ndi mara nma n'ile anya, nwe uche n'amam-ihe nile, mara ihe-ọmuma, nāghọta ihe anāma ama, ndi nwe-kwa-ra ike iguzo n'ulo uku eze; ọ si-kwa-ra ya ka o me ka ha muta akwukwọ na asusu nke ndi Kaldea.


Eze we si ka akpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi-mb͕asi na ndi Kaldea igosi eze nrọ-ya nile. Ha we bata guzo n'iru eze.


Daniel zara n'iru eze, si ihe-nzuzo nke eze juworo, ndi mara ihe na ndi-dibia na ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi nēkè elu-igwe apughi ikọrọ eze ya;


Mb͕e ahu eze mere ka Daniel di uku, ọ di kwa ọtutu onyinye di uku ka o nyere ya, o me-kwa-ra ya ka ọ buru onye nāchi ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, na onye-isi ndi nọchiri anya eze n'ichi ndi-amam-ihe nile nke Babilon.


Ma asi na unu akọ nrọ a na isi-ya, onyinye di iche iche na ugwọ-ọlu na nsọpuru uku ka unu gānata n'akam: n'ihi nka kọrọnum nrọ a na isi-ya.


Ọ nākpọsi nkpu ike, ọ bu kwa otú a ka ọ nāsi, B͕utuenu osisi ahu, b͕ukapusia alaka-ya nile, rurupu akwukwọ-ya nile, kpasa nkpuru-ya: ka anu-ọhia si n'okpuru ya b͕apu, ka nnunu nile si kwa n'alaka-ya fepu.


otù nwoke di n'ala-eze-gi, onye mọ nke chi nsọ nile di nime ya; ọzọ, n'ubọchi nna-gi ìhè na uche na amam-ihe, dika amam-ihe nke chi nile, ka ahuru nime ya: ọzọ, eze ahu, bú Nebukadneza, bú nna-gi, onye-isi nke ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe ka o doro ya, bú nna-gi, eze;


Ma ub͕u a emewo ka ndi mara ihe, bú ndi-dibia, bata n'irum, ka ha we gua ihe a edere, me ka m'mara isi-ya: ma ha apughi ikọ isi ihe a.


Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m'mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka i gāchi achi.


Mb͕e ahu Belshaza kwuru okwu, ha we yibe Daniel uwe-ododo, yibe kwa ya iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, kwusa okwu bayere ya, si na ọ gābu onye nāchi achi dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze ahu.


n'ihi na m'ghaghi isọpuru gi nke-uku, ọ bu kwa ihe ọ bula i gāsim ka m'gēme: ma, biko, bia, kọcharam ndi nka.


Ndi-okenye Moab na ndi-okenye Midian we je, ihe nile iji ju ase di kwa n'aka-ha; ha we biakute Belam, gwa ya okwu nile nke Belak.


Ma ub͕u a, b͕alaga n'onwe-gi la n'ebe nke gi: asirim na m'gāsọpuru gi nke-uku; ma, le, Jehova eb͕ochiwo gi na nsọpuru.


Ndikom Israel we si, Ùnu ahuwo nwoke a nke nārigota? n'ihi na ọ bu ita Israel uta ka ọ nārigota: ọ gēru kwa, na nwoke nke nētib͕u ya, eze gēwere àkù uku me ka ọ buru ọgaranya, ọ gēnye kwa ya nwa-ya nwayi, me ka ulo nna-ya nwere onwe-ya n'Israel.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan