ma ihe abua ndia gābiakute gi n'otù ntabi-anya n'otù ubọchi, bú ọb͕ub͕a-aka-umu na ọnọdu nwanyi di-ya nwuru: dika izu-okè-ha si di ka ha biakwasiworo gi, n'ọtutu mb͕asi-gi, na n'inwebiga-ume-ókè nke ọlu dibia-nrafu nile i nālu.
Muchanu àkú nile; jidesienu ọta nile ike: Jehova akpọtewo mọ nke ndi-eze Midia; n'ihi na imegide Babilon ka nzube-Ya di, ibibi ya: n'ihi na ibọ̀-ọ́bọ̀ Jehova ka ọ bu, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.
N'okpom-ọku-ha ka M'gēme ọṅuṅu-manya nile ha, mee ka ha ṅubiga manya ókè, ka ha we ṅuria ọṅu-agha, raru ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.
M'gēme kwa ndi-isi-ya, na ndi-ya mara ihe, na ndi-ya nāchi ala, na ndi-ya nọchiri anya eze, na ndi-dike-ya, ka ha ṅubiga manya ókè; ha gāraru kwa ura ebighi-ebi, ghara iteta; ọ bu ihe si n'ọnu Eze ahu puta, Jehova nke usu nile nke ndi-agha bu aha-Ya.
N'ihi nka ub͕u a ka agēme ka ha je biri n'ala ọzọ buru ndi-obu-uzọ nke ndi anēme ka ha je biri n'ala ọzọ, oriri ọkwukwa-ozu nke ndi nēseti onwe-ha gēwezuga kwa onwe-ya.