Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 5:29 - Bible Nso

29 Mb͕e ahu Belshaza kwuru okwu, ha we yibe Daniel uwe-ododo, yibe kwa ya iyab͕a ọla-edo n'olu-ya, kwusa okwu bayere ya, si na ọ gābu onye nāchi achi dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

29 Mgbe ahụ Belshaza nyere iwu ka e yikwasị Daniel uwe odo odo ndị eze ahụ, ka e yinye ya ihe olu ọlaedo. O nyekwara iwu ka e kwusaa nʼalaeze ya niile, na o meela ya onye ọchịchị nke atọ nʼalaeze ahụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 5:29
7 Iomraidhean Croise  

Fero we b͕upu nb͕a-aka-akàrà n'aka-ya, b͕aye ya n'aka Josef, yibe ya uwe nke ezi ákwà ọcha, tukwasi iyab͕a ọla-edo n'olu-ya,


N'ihi na Mọdekai, bú onye-Ju, nọsoro eze, bú Ahasuerọs, ọ di kwa uku n'etiti ndi-Ju, na onye ihe-ya tọrọ ọtutu umu-nne-ya utọ; ọ nāchọrọ ndi-ya ọdi-nma, nāgwa kwa nkpuru-ya nile okwu udo.


N'ihi na okpu amara ka ha gāburu isi-gi, Ihe-inya-n'olu ka ha gāburu olu-gi.


Mb͕e ahu eze mere ka Daniel di uku, ọ di kwa ọtutu onyinye di uku ka o nyere ya, o me-kwa-ra ya ka ọ buru onye nāchi ala ahu nile anāchi achi, bú Babilon, na onye-isi ndi nọchiri anya eze n'ichi ndi-amam-ihe nile nke Babilon.


Ma mu onwem anuwo ihe bayere gi, si na i puru ikọ isi ihe nile na itọsi okwu nile nke nāb͕a ghari: ub͕u a, asi na i puru igu ihe a edere, na ime ka m'mara isi-ya, uwe-ododo ka i gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-gi, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka i gāchi achi.


Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi.


na ido ndi-isi atọ ndi-isi-ha, ndi Daniel bu otù nime ha; ka ndi ahu ndi nọchiri anya eze we nākọrọ ha akukọ ihe nile ha nēme, ka o we ghara kwa idi ihe nēfunari eze.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan