Nání otù nku-ume ka ndi di ala bu, ọ bu kwa okwu-ugha ka ndi di elu bu: N'ihe-ọtùtù ha gàrigo elu dika ihe nfe; Ndi ahu nile n'otù di nfe kari otù nku-ume.
Ma gi onwe-gi, nwa nke madu, were n'onwe-gi mma-agha di nkọ, dika aguba nke ndi nākọpu isi ka i gēwere ya n'onwe-gi, i gēme kwa ka ọ gabiga n'isi-gi na n'afu-ọnu-gi: i gēwere kwa n'onwe-gi ihe-ọtùtù itù atù, ke agiri-isi na afu-ọnu ahu.
Jehova enyewo kwa iwu bayere gi, ka aghara igha kwa nkpuru ọ bula ọzọ nke sitere n'aha-gi: n'ulo chi-gi nile ka M'gēbipu arusi apiri api na arusi awuru awu; M'gēdo ílì-gi; n'ihi na elelìwo gi anya.
agēme ka ọlu nke madu nile n'otù n'otù puta ìhè: n'ihi na ubọchi ahu gēgosi ya, n'ihi na agaje ikpughe ya n'ọku; ọku onwe-ya gānwa kwa ọlu madu nile n'otù n'otù, aha ọlu ọ bu.