Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 5:25 - Bible Nso

25 Ma nka bu ihe-odide ahu nke akarari, MENE, MENE, TEKEL, UFASIN.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

25 “Nke a bụ ozi ahụ e dere: mene, mene, tekel, parsin

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 5:25
10 Iomraidhean Croise  

Odide-akwukwọ we si n'aka Elaija, bú onye-amuma, biakute ya, si, Otú a ka Jehova, bú Chineke nke Devid nna-gi, siri, N'ihi na i jeghi ije n'uzọ nile nke Jehoshafat nna-gi, ma-ọbu n'uzọ nile nke Esa, bú eze Juda;


Emewo ka nbili-elu-gi ridarue ala-mọ, ya na olu une-gi nile: n'okpuru gi ka ab͕asaworo ikpuru, ihe-nkpuchi-gi bu kwa ikpuru.


Ma ihe ọjọ abiakwasiwo gi; i gaghi-ama chi-ọbubọ di ya: nbibi gādakwasi kwa gi; i gaghi-enwe ike ikpuchi anya-ya: ila-n'iyì gābiakwasi kwa gi na mberede, nke i nāmaghi.


Mba nile gēfè kwa ya na nwa-ya na nwa nwa-ya òfùfè rue mb͕e mb͕e ala-ya biara: mb͕e ahu ya onwe-ya ka ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ọ fè ha òfùfè.


mb͕e ahu ka esiri n'iru ya zilaga ọbu-aka ahu; ọ bu kwa ihe a nke edere ka akaworori.


Nka bu akukọ-isi ihe ahu: MENE; Chineke agutawo ala-eze-gi ọnu, me ka mb͕e-ya ruzue.


Ọ̀ bughi n'otù ntabi-anya ka ha gēbili, bú ndi nāta gi aru, ka ha gēteta, bú ndi nēme ka i ma jijiji, i gāghọ-kwa-ra ha ihe-npunara?


O werewo ogwe-aka-Ya gosi ike; Ọ chusawo ndi-npako n'èchìchè nke obi-ha.


Ma Chineke siri ya, Onye nēnweghi uche, n'abali a ka anāchọ mkpure-obi-gi n'aka-gi; ma ihe i doziri, ònye gēnwe ha?


Ọzọ kwa, Jehova gēnye Israel n'aka ndi Filistia tiyere gi: echi ka gi na umu-gi ndikom gānọye-kwa-ram: Jehova gēnye kwa ọmuma-ulo-ikwū Israel n'aka ndi Filistia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan