Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 5:23 - Bible Nso

23 ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh:

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

23 Nʼihi na i lelịala Chineke nke eluigwe. Ị wepụtara iko ndị a e si nʼụlọnsọ ukwu ya chịpụta, ka gị na ndịisi alaeze gị, ndị nwunye ha na ndị iko unu, jiri ṅụọ mmanya, mgbe unu nọ na-eto chi niile nke e jiri ọlaọcha na ọlaedo, bronz na igwe, osisi na nkume kpụọ; chi nke na-adịghị ahụ ụzọ, maọbụ nụ ihe; chi nke na-amaghị ihe ọbụla. Ma unu enyeghị Chineke onye na-enye unu ume ndụ na onye ndụ gị na ọganihu gị dị nʼaka ya nsọpụrụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 5:23
47 Iomraidhean Croise  

Ọ we gọzie ya, si, Onye agọziri agọzi ka Abram bu site n'aka Chineke Nke kachasi ihe nile elu, bú Onye-nwe elu-igwe na uwa:


Jehova, bú Chineke, we were ájá sitere n'ala kpuọ madu, O we kuo ume ndu nye n'oghere-imi-ya abua; madu ahu we ghọ nkpuru-obi di ndu.


I tib͕uwo Edom n'ezie, obi-gi we bulie gi elu: ka asọpuru gi na nka, nọdu kwa n'ulo-gi; ma n'ìhi gini ka i nākpali onwe-gi n'ihe ọjọ, ka i we da, gi onwe-gi, na Juda soro gi?


Onye nkpuru-obi nke ihe ọ bula di ndu di n'aka-Ya, Ya na mọ nke anu-aru nile nke madu.


Yà onwe-ya adighi-ahu uzọm nile, Gu kwa nzọ-ukwum nile ọnu?


I nēzobe iru-Gi, ha ama jijiji; I nāchikọta mọ-ha, ha ekubìe ume, We laghachi n'ájá-ha.


Elu-igwe bu elu-igwe Jehova nwere; Ma uwa ka O nyeworo umu madu.


Okporo-uzọm na ndina-alam ka I fùchaworo dika ọka, Ọ bu kwa uzọm nile ka I maworo nke-ọma.


Mọ-ya nāpu apu, o we laghachi n'ala o si puta; N'ubọchi ahu èchìchè-ya nile alawo n'iyì.


N'aka Jehova ka nzọ-ukwu nile nke madu nēsite; Màdu gēsi kwa aṅa ghọta uzọ-ya?


M'gēwere kwa ihe ọjọ ya leta elu-uwa dum madu bi, were kwa ajọ omume-ha leta ndi nēmebi iwu; M'gēme kwa ka npako nke ndi-nganga kwusi, M'gēme kwa idi-elu nke ndi nēme ka madu ma jijiji ka ọ di ala.


Gi onwe-gi we si n'obi-gi, N'elu-igwe ka m'gārigo, n'elu kpakpando nile nke Chineke ka m'gēbuli oche-ezem; m'gānọkwasi kwa n'ugwu nzukọ, na nsọtu nile nke Ugwu:


N'ihi na Jehova nke usu nile nke ndi-agha nwere otù ubọchi nke gādakwasi ihe ọ bula di npako nke di kwa elu, ọ gādakwasi kwa ihe ọ bula ebuliworo elu; ewe me ya ka ọ di ala:


Ub͕u a ka M'gēbili, ka Jehova nāsi; ub͕u a ka M'gēme onwem ka M'di elu; ub͕u a ka agēbulim.


ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku: n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'iyì.


Ònye ka i taworo uta, kwulu kwa? Ònye ka i mewo-kwa-ra olu-gi ka ọ di elu, weli kwa anya-gi abua imegide Ya? ọ bu imegide Onye Nsọ nke Israel.


Otú a ka Chineke, bú Jehova, siri, bú Onye kèworo elu-igwe, seti kwa ha; Onye meworo uwa na ihe nile nke si nime ya aputa ka ọ sa mbara; Onye nēnye ndi bi n'elu ya ume ha nēku, Onye nēnye kwa ndi nējeghari nime ya mọ:


Jehova, amawom na ọ bughi n'aka ya onwe-ya ka uzọ madu di: ọ bughi onye ọ bula nke nēje ije nwe ime ka nzọ-ukwu-ya guzosie ike.


Menu ya ka ọ ṅubiga manya ókè; n'ihi na ọ bu Jehova ka o mere onwe-ya ka ọ di uku megide: Moab gāturu kwa onwe-ya n'ihe ọ b͕ọrọ, ọ gāghọ kwa ihe-ọchì, ọbuná ya onwe-ya.


Ge nti olu ndi nāb͕alaga, ndi nāb͕apu n'ala Babilon, igosi ibọ̀-ọ́bọ̀ nke Jehova, bú Chineke-ayi, na Zaion, bú ibọ̀-ọ́bọ̀ nke ulo uku Ya.


Menu ka ndi-ọb͕a-uta nuru izukọ imegide Babilon, bú ndi nile nāzọ uta ukwu ikwe ya; manu ulo-ikwū-unu imegide ya buruburu; ya ghara inwe ndi b͕apuru ab͕apu: kwughachinu ya ugwọ dika ọlu-ya si di; dika ihe nile si di nke o meworo, menu ya otú a: n'ihi na Jehova ka o meworo nganga megide, megide Onye Nsọ nke Israel.


Obi-gi adiwo elu n'ihi ima-nma-gi, i bibiwo amam-ihe-gi n'ihi onwunwu-ìhè-gi: n'ala ka M'tudaworo gi, n'iru ndi-eze ka M'tọb͕ọworo gi n'ala, ka ha we lekwasi gi.


Nwa nke madu, si onye-ndú Taia, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: N'ihi na obi-gi adiwo elu, i we si, Chi ka m'bu, n'ọnọdu Chineke ka m'nānọkwasi, n'etiti oké osimiri nile; ma gi onwe-gi bu madu, i bughi Chineke, i we do obi-gi ka obi Chineke:


i jiwo iba-uba nke amam-ihe-gi, ji kwa ọzuzu-ahia-gi, me ka àkù-gi ba uba, obi-gi we di elu n'ihi àkù-gi:


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i di elu n'ogologo, na n'ihi na o tiyewo ọnu-ọnu-ya n'etiti alaka b͕ara ọhia, na n'ihi na obi-ya di elu n'idi-elu-ya;


Agāchipu kwa ìgwè madu ahu, obi-ya ewe di elu: ọ gēme kwa ka nnù kwuru nnù madu da ada, ma ọ gaghi-adi ike.


Ub͕u a mu onwem, bú Nebukadneza, nāja, nēbuli, nāsọpuru Eze nke elu-igwe; n'ihi na ọlu-Ya nile bu ezi-okwu, uzọ-Ya nile bu kwa ikpé: ọzọ, ndi nējeghari na npako, Ọ puru ime ka ha di ala.


Ọbuná rue Onye-isi nke usu ahu ka o mere onwe-ya uku;ọ bu kwa n'aka-Ya ka ọ napuru àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, atuba-kwa-ra ọnọdu nke ebe nsọ Ya.


Le, nkpuru-obi-ya afuliwo onwe-ya, o zighi ezi nime ya: ma onye ezi omume gēji okwukwe-ya di ndu.


ejighi kwa aka madu jere ya ozi, dika o nwere ihe ọ bula di Ya nkpà, ebe Ya onwe-ya nēnye madu nile ndu, na ume, na ihe nile;


Ya mere okwu bayere iri ihe achuru n'àjà nye arusi, ayi matara na ọ dighi arusi ọ bula bu ihe n'uwa, ayi mata-kwa-ra na ọ dighi Chineke ọzọ ma-ọbughi otù.


onye nābughi onye ọhu, ka aghara ifuli ya elu, o we dabà n'ọmuma-ikpé ekwensu.


Ọ dighi kwa ihe ekère èkè nke nāputaghi ihè n'iru Ya: kama ihe nile b͕a ọtọ buru kwa ihe emegheworo n'anya-Ya, bú Onye ayi gākọrọ akukọ bayere omume-ayi.


Ma ndi fọduru n'etiti madu, ndi anēb͕ughi n'ihe-otiti ndia, echègharighi isi n'ọlu nile nke aka-ha puta, ka ha we ghara ikpọ isi ala nye ndi-mọ ọjọ, ha na arusi-ha nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke nkume, na nke osisi; nke nāpughi ile ihe anya, ma-ọbu inu ihe, ma-ọbu ije ije:


Ndi-isi ndi Filistia we chikọta onwe-ha ichuru Degon, bú chi-ha, àjà uku, na iṅuri ọṅu: ha si, Chi-ayi enyewo Samson, bú onye-iro-ayi, n'aka-ayi.


Devid we gwa ndikom ndi ya na ha nēguzo okwu, si, Gini ka agēmere nwoke nke gētib͕u onye Filistia nka, wezuga ihe-ita-uta n'aru Israel? n'ihi na ònye bu onye Filistia nka nke anēbìghi úgwù, na ọ gāta usoro-agha nile nke Chineke di ndu uta?


Orù-gi tib͕uru ma ọdum ahu ma bear ahu: onye Filistia nka anēbìghi úgwù gādi kwa ka otù nime ha, n'ihi na ọ bu usoro-agha nile nke Chineke di ndu ka ọ taworo uta.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan