Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 5:2 - Bible Nso

2 Belshaza, mb͕e ọ nēdetu manya-vine ahu ire, ọ siri ka achita iko ọla-edo na ọla-ọcha nke Nebukadneza, bú nna-ya, chiputarari n'ulo uku Chineke nke di na Jerusalem; ka eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-enyi-ya nwanyi we ṅua manya-vine nime ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Mgbe Belshaza na-aṅụ mmanya ya, ọ nyere iwu ka a chịtara ya iko ọlaedo na ọlaọcha nke nna ya bụ Nebukadneza si nʼụlọnsọ ukwu dị na Jerusalem chịkọta, ka eze na ndị a mara aha ha nʼalaeze ya, na ndị nwunye ya, na ndị iko ya jiri ha ṅụọ mmanya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 5:2
23 Iomraidhean Croise  

Devid we si ya, Atula egwu; n'ihi na aghaghm imere gi ebere n'ihi Jonatan, bú nna-gi, m'gēweghachi-kwa-ra gi ubi nile nke Sọl nna-gi; gi onwe-gi gēri kwa nri na table nkem mb͕e nile.


O si n'ebe ahu chipu àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke ulo eze, b͕upia ihe ọla-edo nile nke Solomon, bú eze Israel, mere n'ulo uku Jehova, dika Jehova siri.


Ihe-igu-ọku nile kwa, na ọkwa-nwusa nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.


Mb͕e ọ lusiri ya ọ luta-kwa-ra Meaka nwa-nwayi Absalom; o we muara ya Abaija, na Atai, na Ziza, na Shelomit.


Ọzọ kwa, Meaka nne Esa, bú eze, o wezugara ya n'ibu eze-nwayi, n'ihi na o mere ihe kpatara ima-jijiji nye Ashera; Esa we b͕utue ihe-ya kpatara ima-jijiji, ọ supia ya, sure ya ọku na miri-iyi Kidron.


Ma n'ọb͕ub͕a arọ, eze, bú Nebukadneza, zìri, me ka ọ biarue Babilon, ya na ihe nile anāchọsi ike nke ulo Jehova, o we me Zedakaia, bú nwa-nne-ya, eze Juda na Jerusalem.


Ihe nile nke ulo Chineke, ihe uku na ihe ntà, na àkù nile nke ulo Jehova, na àkù nile nke eze na ndi-isi-ya; ihe ndia nile ka ọ chibatara na Babilon.


Ọzọ kwa, ihe nile nke ulo Chineke, nke ọla-edo na nke ọla-ọcha, nke Nebukadneza chiputara n'ulo uku Chineke di na Jerusalem, chibata ha n'ulo uku nke Babilon, ihe ahu ka Sairọs, bú eze, chiputara n'ulo uku Babilon, nye ha n'aka otù onye, Sheshbaza bu aha-ya, onye o mere onye nāchi ala;


Mba nile gēfè kwa ya na nwa-ya na nwa nwa-ya òfùfè rue mb͕e mb͕e ala-ya biara: mb͕e ahu ya onwe-ya ka ọtutu mba na ndi-eze nke di uku gēme ka ọ fè ha òfùfè.


Mma-agha di n'aru ndi Kaldea, (ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta), na n'ebe ndi bi na Babilon nọ, na n'ebe ndi-isi-ya nọ, na n'ebe ndi-ya mara ihe nọ.


Ọkwa nile kwa, na ihe-igu-ọku nile, na ọkwa-nwusa nile, na ite nile, na ihe-idọba-oriọna nile, na ngaji nile, na iko nile; ihe nke bu ọla-edo, n'ọla-edo, na ihe nke bu ọla-ọcha, n'ọla-ọcha, onye-isi ndi-ob͕ū chipuru ha.


Onye-nwe-ayi we were Jehoiakim, bú eze Juda, na ihe ufọdu nke ulo Chineke, nye n'aka-ya; o we chiri ha bia n'ala Shaina n'ulo chi-ya: ọ bu kwa ihe ndia ka ọ chibatara n'ulo àkù nke chi-ya.


otù nwoke di n'ala-eze-gi, onye mọ nke chi nsọ nile di nime ya; ọzọ, n'ubọchi nna-gi ìhè na uche na amam-ihe, dika amam-ihe nke chi nile, ka ahuru nime ya: ọzọ, eze ahu, bú Nebukadneza, bú nna-gi, onye-isi nke ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe ka o doro ya, bú nna-gi, eze;


Mb͕e ahu emere ka Daniel ba n'iru eze. Eze zara, si Daniel, Ọ̀ bu gi onwe-gi bu Daniel ahu, onye bu otù nime umu ndi nke Juda emere ka ha je biri n'ala ọzọ, ndi eze ahu, bú nnam, chiputara na Juda?


Gi onwe-gi, eze, Chineke Nke kachasi ihe nile elu nyere Nebukadneza, bú nna-gi, ala-eze a na idi-uku na ebube na ima-nma:


ma ọ bu imegide Onye-nwe elu-igwe ka i buliworo onwe-gi; ọ bu kwa aria nile nke ulo-Ya ka ha chitaworo n'iru gi, gi onwe-gi na ndi-isi-gi na ndi bu nwunye-gi na ndi-iko-gi nwanyi nāṅu kwa manya-vine nime ha; ọ bu kwa chi nile nke ọla-ọcha, na nke ọla-edo, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume, nke nādighi-ahu uzọ, nke nādighi-anu kwa ihe, nke nādighi-ama kwa ihe, ka i jaworo: ma Chineke ahu Onye ume-gi di n'aka-Ya, Onye nwe-kwa-ra uzọ-gi nile, ka i nāsọpurugh:


Mb͕e ahu ha chitara iko ọla-edo nke achiputarari n'ulo uku nke ulo Chineke nke di na Jerusalem; eze na ndi-isi-ya na ndi bu nwunye-ya na ndi-iko-ya nwan yi we ṅua manya-vine nime ha.


N'abali ahu ka eb͕uru Belshaza, bú eze Kaldea.


Ha ṅuru manya-vine, we ja chi nile nke ọla-edo, na nke ọla-ọcha, na nke ọla, na nke ígwè, na nke osisi, na nke nkume.


onyinye-ya iji biaru nso bu otù afere ọla-ọcha, ọtùtù-ya di ọgu shekel isi na iri, na otù ọkwa-nwusa ọla-ọcha nke di ọgu shekel atọ na iri n'ọtùtù, dika shekel nke ebe nsọ ahu si di: ha abua juputara n'utu ọka flour agwara manu, ibu onyinye-inata-iru-ọma;


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan