Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 4:7 - Bible Nso

7 Mb͕e ahu ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe batara: mu onwem we ze nrọ ahu n'iru ha; ma ha emeghi ka m'mara isi-ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

7 Ma mgbe ndị mgbaasị, ndị dibịa, ndị Kaldịa na ndị na-agba afa bịara, a kọọrọ m ha nrọ ahụ m rọrọ, ma ha enweghị ike ịgwa m nkọwa ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 4:7
16 Iomraidhean Croise  

oko ọka asa ahu nke fikpọrọ afikpọ we loda okọ ọka asa ahu di nma: m'we gwa ndi-ode-akwukwọ di nsọ; ma ọ dighi onye nēgosim ya.


O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.


Ahuwom onye nēmebi iwu ka ọ nēme madu ka ha ma jijiji, Ahuwokwam ya ka ọ nāwasa onwe-ya dika osisi di ndu n'ala mara ya.


abum Onye nēmebi ihe-iriba-ama nile nke ndi-ekwukwu, M'nēme kwa ka ndi nāju ase wi ara; abum Onye nēme ka ndi mara ihe laghachi azu, M'nēme kwa ka ihe-ọmuma-ha ghọ ihe-nzuzu:


Le, Asiria bu osisi cedar nime Lebanon nke nwere ngalaba mara nma, na ọtutu alaka nēnye ǹdò, na ogologo di elu; ọ bu kwa n'etiti alaka b͕ara ọhia ka ọnu-ọnu-ya di.


bú umu-okoro nke ọ dighi ọlu ọ bula di ha n'aru, ndi mara nma n'ile anya, nwe uche n'amam-ihe nile, mara ihe-ọmuma, nāghọta ihe anāma ama, ndi nwe-kwa-ra ike iguzo n'ulo uku eze; ọ si-kwa-ra ya ka o me ka ha muta akwukwọ na asusu nke ndi Kaldea.


Ndi Kaldea zara n'iru eze, si, Ọ dighi onye ọ bula n'elu uwa nke puru ikọ isi okwu eze: n'ihi na ọ dighi eze ọ bula, ma-ọbu onye-isi, ma-ọbu onye nwere ike n'aru madu, juworo ode-akwukwọ di nsọ ọ bula, ma-ọbu dibia ọ bula, ma-ọbu onye Kaldea ọ bula, ajuju di otú a.


Daniel zara n'iru eze, si ihe-nzuzo nke eze juworo, ndi mara ihe na ndi-dibia na ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi nēkè elu-igwe apughi ikọrọ eze ya;


Ha zara nke ub͕ò abua, si, Ka eze zere ndi-orù-ya nrọ a, isi-ya ka ayi gākọ kwa.


N'ihi nka ka ndi Kaldea ufọdu biaruru nso n'otù mb͕e ahu, bo ndi-Ju ebubo.


Nrọ a ka mu onwem, bú eze, bú Nebukadneza, huworo: ma gi onwe-gi, Belteshaza, kọ akukọ-isi-ya, n'ihi na ndi-amam-ihe nile nke ala-ezem apughi ime ka m'mara isi-ya; ma gi onwe-gi puru, n'ihi na mọ nke chi nsọ nile di nime gi.


Eze kpọsiri nkpu ike, si ka eme ka ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nekè elu-igwe bata. Eze zara, si ndi-amam-ihe nke Babilon, Onye ọ bula nke gāgu ihe a edere, kọ-kwa-ram isi-ya, uwe-ododo ka o gēyi, iyab͕a ọla-edo gādi kwa n'olu-ya, ọ bu kwa dika otù nime ndi-eze atọ n'ala-eze a ka ọ gāchi achi.


Mb͕e ahu ndi-amam-ihe nile nke eze batara: ma ha apughi igu ihe ahu edere, ma-ọbu ime ka eze mara isi-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan