Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 4:5 - Bible Nso

5 Nrọ ka m'huru, o we me ka m'tua egwu; èchìchè nile m'nēchè n'elu ihe-ndinam na ọhù nile nke isim we me ka m'ma jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

5 Arọrọ m nrọ, nke mere ka ụjọ tụọ m. Ihe niile m hụrụ na nrọ mgbe m dina ala nʼelu akwa mere ka oke ụjọ tụọ m.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 4:5
15 Iomraidhean Croise  

O rue, n'ọgwugwu ogologo arọ abua, na Fero nārọ nrọ: ma, le, o nēguzo n'akuku osimiri Nail.


Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego.


Ma n'arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche; mọ-ya we basasia, ura-ya we gwu n'anya-ya.


Eze we si ha, Nrọ ka m'rọworo, mọm we b͕asasia imara nrọ ahu.


Ma ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam di otú a: anọm nāhu, ma le, otù osisi n'etiti uwa, idi-elu-ya di kwa uku.


Anọm nāhu n'ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam, ma, le, otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, nēsi n'elu-igwe rida.


Ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu-ọhia n'ihe-ọkukú nke uwa:


Mb͕e ahu o juru Daniel, onye aha-ya bu Belteshaza, anya nwa mb͕e, èchìchè-ya nile we me ka ọ ma jijiji. Eze zara, si, Belteshaza, ekwela ka nrọ a ma-ọbu akukọ-isi-ya me ka i ma jijiji. Belteshaza zara, si, Onye-nwem, ka nrọ a diri ndi nākpọ gi asì, ka akukọ-isi-ya di-kwa-ra ndi-iro-gi.


Ma eze-nwanyi were n'ihi okwu nile nke eze na ndi-isi-ya bata n'ulo oké oriri ahu: eze-nwanyi zara, si, Eze, di ndu rue mb͕e nile ebighi-ebi; ka èchìchè-gi nile ghara ime ka i ma jijiji, ka ib͕u-maramara nke iru-gi ghara kwa ib͕anwe:


otù nwoke di n'ala-eze-gi, onye mọ nke chi nsọ nile di nime ya; ọzọ, n'ubọchi nna-gi ìhè na uche na amam-ihe, dika amam-ihe nke chi nile, ka ahuru nime ya: ọzọ, eze ahu, bú Nebukadneza, bú nna-gi, onye-isi nke ndi-ode-akwukwọ di nsọ na ndi-dibia na ndi Kaldea na ndi nēkè elu-igwe ka o doro ya, bú nna-gi, eze;


N'arọ mbu nke Belshaza, bú eze Babilon, Daniel huru nrọ na ọhù di iche iche nke isi-ya n'elu ihe-ndina-ya: mb͕e ahu nrọ ahu ka o dere n'akwukwọ, ọ bu isi ihe n'ihe nile ọ huru ka o kwuru.


N'ebe a ka ọgwugwu okwu a di. Ma mu onwem, bú Daniel, èchìchèm nile nēme ka m'ma jijiji nke-uku, ib͕u-maramara nke irum nāb͕anwe kwa n'arum: ma okwu ahu ka m'debere n'obim.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan