Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 4:33 - Bible Nso

33 N'otù oge hour ahu ka okwu a rère n'aru Nebukadneza: ewe si n'ebe madu bi chupu ya, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka ọ nāta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya, rue mb͕e agiri-isi-ya toputara dika ábúbà ugo, mbọ-aka-ya kwa dika mbọ nnunu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

33 Nʼotu oge ahụ kwa, okwu ndị a e kwuru banyere Nebukadneza mezuru. E sitere nʼetiti ụmụ mmadụ chụpụ ya, ọ gakwara nʼọhịa taa ahịhịa dịka oke ehi, igirigi nke eluigwe dekwara ahụ ya ruo mgbe ajị dị ya nʼahụ toro ogologo dịka nku ugo, mbọ ụkwụ na aka ya dịkwa ka mbọ ụmụ nnụnụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 4:33
7 Iomraidhean Croise  

Na iti-nkpu-ọǹù nke ndi nēmebi iwu di nkpunkpu, Na ọṅù nke onye emeruru emeru nādi kwa rue mb͕e ntabi-anya?


Ọ gētiwa kwa ya dika esi etiwa ite ndi-ọkpu-ite nākpu, nke etipiara etipia, Ọ gaghi-enwe ọmiko: ewe ghara ichọta n'etiti ntipia-ya otù ejùjù iji guru ọku n'okpukpo-ntu, ma-ọbu iji kupu miri n'ọdọ-miri.


ọ bu kwa gi ka agāchupu n'ebe madu bi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi, ọ bu kwa ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe ganēde kwa gi, oge asa gāgabiga n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ inye ya ka Ọ gēnye ya.


Aganēsi kwa n'ebe madu bi chupu gi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi; ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, oge asa gāgabiga kwa n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ka Ọ nēnye ya.


esi-kwa-ra n'ebe umu nke madu bi chupu ya, eme-kwa-ra obi-ya ka ọ di ka nke anu-ọhia, ọ bu kwa n'etiti inyinya-ibu-ọhia ka ebe-obibi-ya di; ihe-ọkukú ka anēme ka ọ ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya: rue mb͕e ọ mara na Chineke Nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, na ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ido onye-isi-ya ka Ọ nēdo.


N'otù oge hour ahu ka nkpisi-aka ufọdu nke aka madu putara, de ihe na ncherita-iru ihe-idọba-oriọna n'elu nzu etere na mb͕idi ulo uku eze: eze nāhu kwa ọbu-aka ahu nēde ihe.


N'ihi na unu onwe-unu matara nke-ọma na dika onye-ori nābia n'abali, otú a ka ubọchi nke Onye-nwe-ayi nābia.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan