Daniel 4:32 - Bible Nso32 Aganēsi kwa n'ebe madu bi chupu gi, ọ bu kwa n'etiti anu ọhia ka ebe-obibi-gi gādi; ihe-ọkukú ka agēme ka i ta dika ehi, oge asa gāgabiga kwa n'isi gi; rue mb͕e i gāma na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ka Ọ nēnye ya. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a32 A ga-esi nʼetiti ndị mmadụ chụpụ gị, ka ị gaa soro ụmụ anụmanụ biri nʼọhịa. Ị ga-atakwa ahịhịa dịka oke ehi, afọ asaa ga-agasị tutu ruo mgbe ị ghọtara na ọ bụ Onye kachasị ihe niile elu na-achị achị nʼalaeze dị niile nke ụwa. Ọ na-enyefekwa ha nʼaka onye ọbụla ọ chọrọ ka ọ chịa.” Faic an caibideil |
esi-kwa-ra n'ebe umu nke madu bi chupu ya, eme-kwa-ra obi-ya ka ọ di ka nke anu-ọhia, ọ bu kwa n'etiti inyinya-ibu-ọhia ka ebe-obibi-ya di; ihe-ọkukú ka anēme ka ọ ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya: rue mb͕e ọ mara na Chineke Nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, na ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ido onye-isi-ya ka Ọ nēdo.