Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 4:22 - Bible Nso

22 gi onwe-gi ka ọ bu, eze, n'ihi na i bawo uba, di ike: idi-uku-gi abawo kwa uba, rute n'elu-igwe, ebe i nāchi erutewo kwa na nsọtu uwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 osisi ahụ bụ gị onwe gị, eze. Nʼihi na i toola bụrụ onye dị ike na onye dị ukwuu. Ịdị ukwu gị eruola nʼeluigwe. Ọchịchị gị eruokwala nʼakụkụ niile nke ụwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 4:22
18 Iomraidhean Croise  

Ha we si, Ngwa, ka ayi wuere onwe-ayi obodo, na ulo-elu, nke elu-ya gēru n'elu-igwe, ka ayi mekwara onwe-ayi aha; ka ayi we ghara ib͕asa n'elu uwa nile.


Ọ rọ nrọ, ma, le, ubube nke eguzoro n'ala, ma elu-ya nēmetu ebe elu-igwe di: ma, le, ndi-mọ-ozi Chineke nārigo nārida na ya.


Netan we si Devid, Gi onwe-gi ka nwoke ahu bu. Otú a ka Jehova, bú Chineke Israel, siri, Mu onwem tere gi manu ibu eze Israel, Mu onwem naputa-kwa-ra gi n'aka Sọl;


Ma otù onye-amuma Jehova nọ n'ebe ahu, Oded bu aha-ya: ọ pua izute usu-ndi-agha ahu nke nābiaru Sameria, ọ si ha, Le, ọ bu n'ihi na Jehova, bú Chineke nke nna-unu-hà, kosara Juda ọnuma, ka O nyere ha n'aka-unu, unu we were ọnuma nke ruru elu-igwe b͕ue ha.


N'ihi na ebere-Gi di uku kari elu nke elu-igwe, Ezi-okwu-Gi di kwa uku rue mbara-ígwé.


Jehova, n'elu-igwe ka ebere-Gi di; Ikwesi-ntukwasi-obi-Gi nēru mbara-ígwé.


Mu onwem emewo uwa, na madu na anumanu nke di n'elu uwa, site n'ikem di uku, site kwa n'ogwe-akam nke eseteri eseti; ewerewokwam ya nye onye o ziri ezi n'anyam inye.


si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:


ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma:


Osisi ahu b͕ara ab͕a, di ike, idi-elu-ya rute-kwa-ra n'elu-igwe, apuru ihu ya anya site na nsọtu nke uwa nka nile.


nke akwukwọ-ya mara nma, nke nkpuru-ya riri nne, nke ihe-oriri izuru ihe nile di ya; nke n'okpuru ya ka anu ọhia nēbi, nke ọ bu n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nwere ebe-obibi-ha:


N'ọgwugwu ọnwa iri na abua, n'elu ulo uku ala-eze ahu nke Babilon ka ọ nọ nējeghari.


N'otù mb͕e ahu ka ihe-ọmumam nālaghachikutem; ọzọ, n'ihi ebube nke ala-ezem, ima-nmam na ib͕u-maramaram nālaghachikutem; ọ bu kwa mu ka ndi-ndum-ọdum na ndi-isim nēkpere; ọzọ, n'elu ala-ezem ka emerem ka m'nọzie, ọ bu kwa idi-uku nke kachasi ka atukwasirim.


N'ihi na Jọn nāsi ya, O zighi gi ezi n'iwu inwe ya dika nwunye.


n'ihi na nmehie-ya nile rapakọrọ n'otù rue elu-igwe, Chineke cheta-kwa-ra ajọ omume-ya nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan