Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 4:14 - Bible Nso

14 Ọ nākpọsi nkpu ike, ọ bu kwa otú a ka ọ nāsi, B͕utuenu osisi ahu, b͕ukapusia alaka-ya nile, rurupu akwukwọ-ya nile, kpasa nkpuru-ya: ka anu-ọhia si n'okpuru ya b͕apu, ka nnunu nile si kwa n'alaka-ya fepu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

14 O tiri mkpu nʼolu dị ike sị, ‘Gbudanụ osisi ukwu ahụ, gbukasịakwa alaka ya niile. Kụpụsịanụ akwụkwọ ndụ niile dị nʼelu ya. Ghasaakwanụ mkpụrụ ya niile, ka ụmụ anụmanụ si nʼokpuru ndo ya gbapụ, ka ụmụ nnụnụ site nʼalaka ya fepụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 4:14
19 Iomraidhean Croise  

Àkpà-nwa gēchezọ ya, aru-ya gātọ ikpuru utọ n'oriri; Agaghi-echeta kwa ya ọzọ: Agānyaji kwa ajọ omume dika osisi.


Mu onwem emewo uwa, na madu na anumanu nke di n'elu uwa, site n'ikem di uku, site kwa n'ogwe-akam nke eseteri eseti; ewerewokwam ya nye onye o ziri ezi n'anyam inye.


Sinu n'etiti Babilon b͕alaga, wepuga-kwa-nu onwe-unu n'otù n'otù; unu ekwela ka eme unu ka unu dere du n'ajọ omume-ya: n'ihi na mb͕e ibọ̀-ọ́bọ̀ ka ọ buru Jehova; nmeso obodo ahu ka Ya onwe-ya nākwughachi ya.


Ayi gāgwọtawori Babilon, ma agwọtaghi ya: rapunu ya, ka ayi la, onye ọ bula n'ala-ya: n'ihi na ikpé-ya erutuwo elu-igwe, ebuliwo kwa ya rue mbara-ígwé.


N'ihi nka ka Onye-nwe-ayi Jehova ji si otú a: N'ihi na i di elu n'ogologo, na n'ihi na o tiyewo ọnu-ọnu-ya n'etiti alaka b͕ara ọhia, na n'ihi na obi-ya di elu n'idi-elu-ya;


ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma:


Onye-nkwusa nākpọsi kwa nkpu ike, si, Ọ bu unu ka anāgwa okwu, unu ndi di iche iche, na unu mba di iche iche, na unu ndi nāsu asusu di iche iche, si,


Akwukwọ-ya mara nma, nkpuru-ya ri-kwa-ra nne, ihe-oriri izùru ihe nile di kwa ya: n'okpuru ya ka anu ọhia nēze ǹdò, ọ bu kwa n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nēbi, esite kwa na ya zù anu-aru nile, bú madu.


Ma ebe eze huru otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, ka o nēsi n'elu-igwe ridata, si, B͕utuenu osisi ahu, mebie ya; ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu ọhia, rue mb͕e oge asa gāgabiga n'isi ya;


N'ọgwugwu ọnwa iri na abua, n'elu ulo uku ala-eze ahu nke Babilon ka ọ nọ nējeghari.


Ma mb͕e obi-ya di elu, mb͕e mọ-ya di kwa ike ime ihe-nganga, emere ka o si n'oche-eze nke ala-eze-ya ridata, ọ bu kwa ebube-ya ka ewezugara n'ebe ọ nọ:


esi-kwa-ra n'ebe umu nke madu bi chupu ya, eme-kwa-ra obi-ya ka ọ di ka nke anu-ọhia, ọ bu kwa n'etiti inyinya-ibu-ọhia ka ebe-obibi-ya di; ihe-ọkukú ka anēme ka ọ ta dika ehi, igirigi nke elu-igwe nēde kwa aru-ya: rue mb͕e ọ mara na Chineke Nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, na ọ bu kwa onye ọ bula Ọ nāchọ ido onye-isi-ya ka Ọ nēdo.


Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile: ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.


Anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.


Ma ọbuná ub͕u a anātukwasi kwa anyu-ike na nkpọrọgwu osisi nile; ya mere anēb͕utu osisi ọ bula nke nāmighi nkpuru ọma, tubà kwa ya nime ọku.


o we were oké olu tie nkpu, dika ọdum nāb͕ọ uja: mb͕e o tiri nkpu, éb͕è-elu-igwe asa ahu we kwue olu-ha.


O we were olu ike tie nkpu, si, Ọ dawo, ọ dawo, bú Babilon uku ahu, ọ ghọwo kwa ebe-obibi nke ndi-mọ ọjọ, na ulo-nkpọrọ nke mọ nile ọ bula nādighi ọcha, na ulo-nkpọrọ nke nnunu nile ọ bula nke nādighi ọcha nke akpọwo-kwa-ra asì.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan