Daniel 4:13 - Bible Nso13 Anọm nāhu n'ọhù nile nke isim n'elu ihe-ndinam, ma, le, otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, nēsi n'elu-igwe rida. Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a13 “Mgbe m nọkwa na-arọ nrọ ahụ, ahụrụ m otu nʼime ndị mmụọ ozi Chineke ka o si nʼeluigwe na-arịdata. Faic an caibideil |
N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya.
Ma ebe eze huru otù onye nāmuru anya, nke bu kwa onye nsọ, ka o nēsi n'elu-igwe ridata, si, B͕utuenu osisi ahu, mebie ya; ma rapunu ogwe nkpọrọgwu-ya nile n'ala, ọbuná n'ab͕u ekere ya nke ígwè na ọla, n'ahihia ndu nke ọhia; ka igirigi nke elu-igwe de kwa ya, ka òkè-ya di kwa n'etiti anu ọhia, rue mb͕e oge asa gāgabiga n'isi ya;