Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 4:12 - Bible Nso

12 Akwukwọ-ya mara nma, nkpuru-ya ri-kwa-ra nne, ihe-oriri izùru ihe nile di kwa ya: n'okpuru ya ka anu ọhia nēze ǹdò, ọ bu kwa n'alaka-ya ka nnunu nile nke elu-igwe nēbi, esite kwa na ya zù anu-aru nile, bú madu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Akwụkwọ ya dị mma ile anya, alaka ya jupụtakwara na mkpụrụ hiri nne, o gbokwara mkpa nri nye mmadụ niile. Ụmụ anụmanụ niile nke ọhịa na-abịakwa nʼokpuru ndo ya izuike. Ụmụ nnụnụ niile nke eluigwe na-ebikwa nʼalaka ya. Ọ bụkwa site na ya ka a na-azụ ihe niile dị ndụ nri.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 4:12
13 Iomraidhean Croise  

Ọ nēwezuga obi ndi-isi nke ndi uwa, We me ka ha waghari n'ebe tọb͕ọrọ n'efu ebe uzọ nādighi.


N'ihi na olile-anya diri osisi na ọ gēpute ọzọ, ma eb͕utue ya, Na ome-ya agaghi-akwusi kwa.


Site n'ísì miri ọ gāma akwukwọ, Wa kwa alaka dika ihe akuru aku.


Ume nke oghere-imi-ayi, bú onye Jehova etere manu, ka ejidere n'olùlù-ha; Onye ayi siri, N'okpuru ǹdò-ya ka ayi gādi ndu n'etiti mba nile.


n'ugwu nke ebe di elu nke Israel ka M'gāku ya: ọ gāwaputa kwa ngalaba, mia nkpuru, ghọ osisi cedar mab͕uru onwe-ya: n'okpuru ya ka nnunu nile di iche iche gēbi; na ǹdò alaka-ya nile ka ha gēbi.


Ha onwe-ha so-kwa-ra ya ridarue ala-mọ, jekuru ndi ejiri mma-agha b͕u; e, ndi bu ogwe-aka-ya, ndi biri na ǹdò-ya n'etiti mba nile.


Ọ nākpọsi nkpu ike, ọ bu kwa otú a ka ọ nāsi, B͕utuenu osisi ahu, b͕ukapusia alaka-ya nile, rurupu akwukwọ-ya nile, kpasa nkpuru-ya: ka anu-ọhia si n'okpuru ya b͕apu, ka nnunu nile si kwa n'alaka-ya fepu.


nke ọ bu ezie na ọ di ntà kari nkpuru nile; ma mb͕e ọ bara uba, o bùkari ihe nile anāku n'ubi, we ghọ osisi, nke mere ka anu-ufe nke elu-igwe bia nānọ n'alaka-ya.


Ma ọ dighi onye ọ bula matara ihe bayere ubọchi ahu ma-ọbu oge hour ahu, ọbuná ndi-mọ-ozi nke elu-igwe amat'aghi, Ọkpara ahu amataghi kwa, kama ọ bu nání Nnam matara.


ma mb͕e ọ bula aghara ya, o tó, ghọ ihe bùkari ihe nile anāku n'ubi, o we waputa oké alaka; nke mere ka anu-ufe nile nke elu-igwe pu inọ n'okpuru ǹdò-ya.


O yiri nkpuru mustard, nke madu were, tubà n'ubi nke aka ya ab͕ara ogige; o we ba uba, ghọ osisi; anu-ufe nke elu-igwe we nọ n'alaka-ya.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan