Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 3:22 - Bible Nso

22 N'ihi nka, n'ihi na okwu eze di ọku ọku, na n'ihi na oké ọku ahu bu ihe emeworo ka ọ dikari ọku ókè, ọbuná ndikom ahu ka ire ọku b͕uru, bú ndi meworo ka Shedrak na Mishak na Abed-nego rigota.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Ebe ọ bụ nʼokwu eze dị ọkụ ọkụ, tinyere na ọkụ ahụ na-enwusi ike, o mere ka ire ọkụ regbuo ndị agha ahụ tụbara Shedrak, na Mishak, na Abednego.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 3:22
10 Iomraidhean Croise  

O je chọta ozu-ya, ka atupuru ya n'uzọ, na inyinya-ibu na ọdum, ka ha nēguzo n'akuku ozu ahu: ọdum erighi ozu ahu, ọ dọb͕ughi kwa inyinya-ibu ahu.


Ndi Iiipt we di ike n'aru ndi Israel izipu ha n'ala-ha ngwa ngwa; n'ihi na ha siri, Ayi nile bu ndi nwuru anwu.


Adọputawo onye ezi omume n'ahuhu, Onye nēmebi iwu ba n'ọnọdu ya.


Ihe-nb͕aputa ib͕aputa onye ezì omume ka onye nēmebi iwu bu; Ọzọ, n'ọnọdu ndi ziri ezi ka onye nāghọb͕u aghọb͕u nọ.


Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego.


ọ zara, si Ariok, bú onye nke eze nke nwere ike n'aru madu, N'ihi gini ka iwu a di ọku ọku site n'iru eze? Mb͕e ahu ihe Ariok mere ka Daniel mara okwu a.


Eze we kwue, ha we me ka ndikom ahu bia, bú ndi borori Daniel ebubo, ọ bu kwa n'olùlù ọdum ka ha tubàra ha na umu-ha na ndi bu nwunye-ha; ha akēruteghi kwa ala olùlù ahu tutu ọdum enwe ike n'aru ha, tapia ọkpukpu-ha nile.


O we tubà ego ọla-ọcha ahu nile n'ulo nsọ, wezuga onwe-ya; o we je, kwub͕u onwe-ya.


Mb͕e Herod chọsiri ya, ma ọ chọtaghi ya, ọ kpe ndi-nche-ya ikpé, nye iwu ka ewe dupu ha ib͕u ha. O we si na Judia ridata na Sisaria, we nọgide n'ebe ahu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan