Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 3:2 - Bible Nso

2 Nebukadneza, bú eze, zi-kwa-ra ka achikọta ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpé, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, ibia n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobeworo ọtọ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 Eze Nebukadneza ziri ozi ka e zie ndị nnọchite anya eze niile, ndịisi, ndị na-achị achị, ndị ndụmọdụ ya niile, ndị na-elekọta ụlọakụ ya niile, ndị ọkaikpe, ndị maji na-edozi okwu na ọtụtụ ndị ọzọ nọkwa nʼisi ọchịchị akụkụ niile nke ala ahụ, ka ha bịa nʼụbọchị a ga-edo oyiyi ahụ nsọ bụ nke eze Nebukadneza guzobere.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 3:2
10 Iomraidhean Croise  

Jeroboam we me ememe n'ọnwa nke-asatọ, n'ubọchi nke-iri-na-ise nke ọnwa ahu, dika ememe nke di na Juda, o we rigorue ebe-ichu-àjà ahu; otú a ka o mere na Bet-el, ichuru umu-ehi ahu, bú nke o mere, àjà: o guzo na Bet-el ndi-nchu-àjà nke ebe di elu nke o mere.


Ọ buru na onye nāchi achi aṅa nti okwu-ugha, Ndi nile nējere ya ozi bu ndi nēmebi iwu.


Ndi ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi ahu, na ndi ahu nāchi achi, na ndi-ndum-ọdu eze, ebe ha zukọtaworo, ha hu-kwa-ra ndikom ndia, na ọku ahu enweghi ike n'aru-ha, ọku aṅachaghi kwa agiri-isi nke isi-ha, uwe-ukwu-ha ab͕anweghi kwa, ísì ọku agabigaghi kwa n'aru ha.


Mb͕e ahu ndi nọchiri anya eze, na ndi-isi, na ndi nāchi achi, na ndi-ikpe, na ndi-odozi-àkù, na ndi-ndum-ọdu, na ndi-odozi-okwu, na ndi nile nāchi ala anāchi achi, nēzukọta n'irara onyinyo ahu nye, bú nke Nebukadneza, bú eze, guzobere ọtọ; ha we nēguzo ọtọ n'iru onyinyo ahu nke Nebukadneza guzobere.


ndinyom ahu we kpọ ndi Israel ibia n'àjà chi nile ha; ndi Israel we rie ihe, kpọ isi ala nye chi nile ha.


onye ya na ndi-eze uwa kwara iko, eme-kwa-ra ka manya ikwa-iko-ya bà ndi bi n'uwa n'anya.


Ndi-isi ndi Filistia we chikọta onwe-ha ichuru Degon, bú chi-ha, àjà uku, na iṅuri ọṅu: ha si, Chi-ayi enyewo Samson, bú onye-iro-ayi, n'aka-ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan