Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 3:13 - Bible Nso

13 Mb͕e ahu Nebukadneza n'oké iwe na ọnuma-ya siri ka eme Shedrak na Mishak na Abed-nego ka ha bia. Mb͕e ahu ha mere ka ndikom ndia bia n'iru eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Nebukadneza nʼọnọdụ oke iwe nyere iwu ka a kpọta Shedrak, na Mishak, na Abednego. Ya mere, a kpọbatara ndị ikom a nʼihu eze,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 3:13
15 Iomraidhean Croise  

ma Ken na onyinye-inata-iru-ọma-ya, O leghi ha anya ọma. Ken we we iwe di ọku nke-uku, iru-ya we b͕arua.


Ka nne-bear nke b͕ara aka umu-ya zute madu, Kari onye-nzuzu n'uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ.


Nkume di arọ́, ájá bu kwa ibú; Ma nkpasu-iwe nke onye uche-ya b͕agọrọ ab͕agọ di arọ́ kari ha abua.


Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.


Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego.


N'ihi nka eze were iwe, iwe-ya we di ọku nke-uku, o we si ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon la n'iyi.


Mb͕e ahu Nebukadneza juputara n'ọnuma, udi iru-ya we b͕anwe imegide Shedrak na Mishak na Abed-nego: ya mere ọ zara, si ka ha me oké ọku ahu ka ọ di ọku ub͕ò asa kari otú anēmeri ka ọ di ọku.


e, n'iru ndi-isi na ndi-eze ka agēkuru kwa unu je n'ihim, iburu ha na ndi mba ọzọ àmà.


Ma unu onwe-unu lezie anya n'onwe-unu: n'ihi na ha gārara unu nye n'aka nnọkọ-ikpé di iche iche; n'ulo-nzukọ di iche iche ka agāpia kwa unu ihe; n'iru ndi-isi na ndi-eze ka unu gēguzo kwa n'ihim, iburu ha àmà.


Ma mb͕e ihe ndia nile akēmeghi, ha gātukwasi unu aka-ha, sob͕u kwa unu, nārara unu nye n'aka ulo-nzukọ na ulo-nkpọrọ, n'ebe anēduputa unu ga n'iru ndi-eze na ndi-isi n'ihi aham.


Ma ndi ahu juputara n'enweghi-uche; ha we nēkwurita n'etiti onwe-ha ihe ha gēme Jisus.


Ma mb͕e ubọchi ufọdu gasiri Filiks biaruru, ya na Drusila, nwunye nke aka ya, onye bu nwanyi Ju, o we kpọta Pọl, we nu okwu-ya bayere okwukwe nime Kraist Jisus.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan