Daniel 3:10 - Bible Nso10 Gi onwe-gi, eze, enyewo iwu, si, na onye ọ bula nke gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ọla-edo ahu: Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a10 Gị, onwe gị nyere iwu, na onye ọbụla nụrụ ụda opi ike, ọja, une, ụbọ akwara maọbụ ihe egwu ọzọ ga-akpọ isiala sekpuoro ihe ahụ e ji ọlaedo kpụọ, Faic an caibideil |
Ub͕u a asi na unu ejikerewo na mb͕e unu gānu olu nke opì-ike, na nke ọ̀jà, na nke ubọ-akwara, na nke sackbut, na nke une, na nke dulcimer, na nke ubọ na opì nile di iche iche, unu gāda n'ala kpọ isi ala nye onyinyo ahu nke m'meworo, ọ di nma: ma asi na unu adighi-akpọ isi ala, n'otù mb͕e ahu ka agātubà unu n'etiti oké ọku nēnwu ajọ onwunwu; ònye bu kwa chi ahu nke gānaputa unu n'akam?
Mb͕e ahu ha biaruru nso, kwue okwu n'iru eze bayere isọ-nsọ eze, si: Ọ̀ dighi isọ-nsọ i kayere aha, na onye ọ bula nke gāriọ chi ọ bula ma-ọbu madu ọ bula aririọ rue orú ubọchi na iri, ma-ọbughi nání gi, eze, na agātubà ya n'olùlù ọdum? Eze zara, si, Ihe nke nēguzosi ike ka ihe a bu, dika iwu Midia na Peasia si di, nke nādighi-agabiga.