Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 2:49 - Bible Nso

49 Daniel we riọ eze, o we do Shedrak na Mishak na Abed-nego ndi-isi ọlu nke ala ahu anāchi achi, bú Babilon: ma Daniel nọ n'ọnu-uzọ-ama eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

49 Ma dịka Daniel siri rịọ eze, o mekwara ka Shedrak, Mishak na Abednego bụrụ ndị na-elekọta ihe niile a na-eme eme nʼala Babilọn, Daniel nʼonwe ya nọdụrụ nʼogige eze.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 2:49
12 Iomraidhean Croise  

Ma mb͕e achikọtara ha nke ub͕ò abua, bú umu-ab͕ọghọ nāmaghi nwoke, Mọdekai we nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze.


Na mb͕e ahu, mb͕e Mọdekai nānọdu n'ọnu-uzọ-ama eze, Bigtan na Teresh, bú ndi-nchedo abua nke eze, nime ndi nēche nbata-uzọ, were iwe, chọ iseti aka megide eze, bú Ahasuerọs.


Ndi-orù nile nke eze, ndi nọ n'ọnu-uzọ-ama eze, we nēruru ala, nākpọ kwa isi ala nye Heman: n'ihi na otú a ka eze nyere iwu bayere ya. Ma Mọdekai adighi-eruru ala, ọ dighi-akpọ kwa isi ala nye ya.


Mb͕e obi ndi ezi omume nātọ ha utọ, ọtutu ima-nma di: Ma mb͕e ndi nēmebi iwu nēbili, agāchọ madu achọ.


na ndi-isi nile nke eze Babilon batara, we nọdu n'ọnu-uzọ-ama nke etiti, bú Neagal-shareza, na Samga-nebo, na Sasekim, bú Rab-saris, na Neagal-shareza, bú Rab-mag, na ndi-isi nile nke eze Babilon fọduru.


Ma umu-okoro anọ ndia, Chineke nyere ha ọmuma-ihe na uche n'akwukwọ na amam-ihe nile: Daniel ghọta-kwa-ra ọhù na nrọ nile.


Onye-isi ndi-onozi we gua ha aha: o we gua Daniel aha Belteshaza, gu kwa Hananaia aha Shedrak, gu kwa Mishael aha Mishak, gu kwa Azaraia aha Abed-nego.


Mb͕e ahu Daniel lara n'ulo-ya, me ka Hananaia na Mishael na Azaraia, bú ndi-ibe-ya, mara okwu ahu:


Nebukadneza, bú eze, mere onyinyo ọla-edo, idi-elu-ya bu ọgu cubit atọ, obosara-ya bu cubit isi: ọ guzobere ya ọtọ na ndagwurugwu Dura n'ala-ọchichi Babilon.


na ido ndi-isi atọ ndi-isi-ha, ndi Daniel bu otù nime ha; ka ndi ahu ndi nọchiri anya eze we nākọrọ ha akukọ ihe nile ha nēme, ka o we ghara kwa idi ihe nēfunari eze.


Kpọnu ihe ọjọ asì, hunu ezi ihe n'anya, menu ikpé ziri ezi ka o guzosie ike n'ọnu-uzọ-ama: eleghi anya Jehova, bú Chineke nke usu nile nke ndi-agha, gēmere ndi Josef fọduru amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan