Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 2:35 - Bible Nso

35 Mb͕e ahu ka etipiara ígwè ahu na urọ na ọla ahu na ọla-ọcha ahu na ọla-edo ahu n'otù, o we di ka ib͕ob͕o-ọka sitere n'ebe-nzọcha-ọka nke mb͕e okpom-ọku; ifufe we fechapu ha, ewe ghara ihuru ha ebe ọ bula: nkume ahu nke tipiara onyinyo ahu we ghọ oké ugwu, juputa uwa nka nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

35 Mgbe ahụ, e tijisịrị igwe ahụ na ụrọ ahụ, bronz ahụ na ọlaọcha ahụ nakwa ọlaedo ahụ niile. Ha dịka igbugbo ọka nke na-adị nʼebe a na-azọcha ọka nʼoge okpomọkụ. Ifufe fechapụsịrị ha na-ahapụghị ihe ngosi ọbụla. Ma nkume ahụ dakwasịrị ihe ahụ awuru awu mechara ghọọ ugwu dị ukwuu, nke jupụtara ụwa niile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 2:35
28 Iomraidhean Croise  

Na mb͕e anēme ka ha di ọku ha tọb͕ọro n'efu: Mb͕e ọ di ọku, ha tapuworo n'ọnọdu-ha.


N'ihi na ifufe agabigawo ya n'isi, o we ghara idi; Ọnọdu-ya agaghi-ama kwa ya ọzọ.


Nsọtu nile nke uwa gēcheta, laghachikute kwa Jehova: Ab͕uru nile nke mba nile gākpọ kwa isi ala n'iru Gi.


Ma ọ fọduru nwa mb͕e, onye nēmebi iwu agaghi-adi kwa: I gēlekwasi kwa ọnọdu-ya anya, ma ọ gaghi-anọ.


O we gabiga, ma, le, ọ nọgh: M'we chọ ya, ma achọtaghi ya.


Nēme ka agha nile kwusi rue nsọtu uwa; Ọ nāb͕aji uta, b͕upia kwa ube; Ọ nēsure ub͕ọ-ala nile n'oku.


Uwa nile gākpọ isi ala nye Gi, Bùku kwa Gi abù ọma; Ha gābùku aha-Gi abù ọma. Selah


Mba nile ndi I meworo gābia kpọ isí ala n'iru Gi, Onye-nwe-ayi; Ha gāsọpuru kwa aha-Gi.


Ha agaghi-eme ihe ọjọ, ha agaghi-ebibi kwa, n'ugwu nsọm nile: n'ihi na ihe-ọmuma Jehova gējuputa uwa, dika miri si ekpuchi oké osimiri.


Jọnu njọ, unu ndi di iche iche, ma agētipia unu; ṅa-kwa-nu nti, unu ndi nile nọ n'ebe di anya nke uwa: kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu; kenu ihe n'úkwù-unu, ma agētipia unu.


Ma n'ubọchi-ha, bú eze ndia, ka Chineke nke elu-igwe gēme ka otù ala-eze bilie, nke agaghi-emebi emebi rue mb͕e abighi-ebi, ọ bu kwa ọbubu-eze-ya ka anāgaghi-arapuru ndi ọzọ; ọ gētipia ala-eze ndia nile me ka ha gwusia, ma ya onwe-ya gēguzosi ike rue mb͕e ebighi-ebi.


N'ihi nka ka ha gādi ka igwe-oji ututu, na dika igirigi nke nāla n'isi-ututu, dika ib͕ob͕o-ọka nke oké ifufe nēfechapu n'ebe-nzọcha-ọka, na dika anwuru-ọku si apu na window.


Bilie, zọcha, gi ada Zaion: n'ihi na mpi-gi ka M'gēme ka ọ ghọ ígwè, ọ bu kwa ukwu-gi ka M'gēme ka ha ghọ ọla: i gāzọpia kwa ọtutu ndi di iche iche: M'gēwezuga kwa urù-ha nye Jehova, wezuga kwa àkù-ha nye Onye-nwe uwa nka nile.


Ọ gēru kwa, n'ubọchi ahu, na M'gēme Jerusalem ka ọ ghọrọ ndi nile di iche iche nkume ebubo; ndi nile ndi ji ya ebo onwe-ha gākọwaputa onwe-ha ọnyá nke-uku; mba nile nke uwa gāchikọta kwa onwe-ha imegide ya.


N'ihi na Ọ ghaghi ibu eze, rue mb͕e Ọ gēdebewori ndi-iro-Ya nile n'okpuru ukwu-Ya.


Mọ-ozi nke-asa we fùa opì; oké olu we da n'elu-igwe, ha we si, Ala-eze nke uwa aghọwo ala-eze nke Onye-nwe-ayi, na nke Kraist-Ya: Ọ gābu kwa eze rue mb͕e nile ebighi-ebi.


ha enweghi kwa ike, ahughi kwa ọnọdu-ha ọzọ n'elu-igwe.


M'we hu oké oche-eze di ọcha, na Onye nānọkwasi ya, Onye uwa na elu-igwe b͕apuru n'iru Ya; ahughi kwa ebe ọ bula nye ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan