3 Eze we si ha, Nrọ ka m'rọworo, mọm we b͕asasia imara nrọ ahu.
3 ọ sịrị ha, “Arọrọ m nrọ nke na-enye m nsogbu nʼobi. Achọrọ m ịma ihe ọ pụtara.”
Ha si ya, Nrọ ka ayi rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya. Josef we si ha, Ọ̀ bughi Chineke nwe akukọ-isi nrọ nile? biko, kọrọnu m.
Fero we si Josef, Nrọ ka m'rọworo, ọ dighi kwa onye nākọ isi-ya: ma mu onwem anuwo okwu bayere gi, si, na i nānu nrọ ikọ isi-ya.
O rue, n'ututu, na mọ-ya b͕asasiri; o we ziga kpọ ndi-ode-akwukwọ di nsọ nile nke Ijipt, na ndi-ya nile mara ihe: Fero we kọrọ ha nrọ-ya; ma ọ dighi onye nākọrọ Fero isi-ha.
Ma n'arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Nebukadneza, Nebukadneza rọrọ nrọ di iche iche; mọ-ya we basasia, ura-ya we gwu n'anya-ya.
Nrọ ka m'huru, o we me ka m'tua egwu; èchìchè nile m'nēchè n'elu ihe-ndinam na ọhù nile nke isim we me ka m'ma jijiji.