Daniel 2:21 - Bible Nso21 ọ bu Ya onwe-ya nāb͕anwe mb͕e na mb͕e akara àkà: Ọ nēwezuga ndi-eze, nēme kwa ka ndi-eze bilie: Ọ nēnye ndi mara ihe amam-ihe-ha, Ọ nēnye kwa ndi mara nghọta ihe-ọmuma: Faic an caibideilBaịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a21 Ọ na-agbanwe oge na mgbe dị iche iche; Ọ na-ebuli ndị eze na-akwatụkwa ha. Ọ na-enye onye maara ihe amamihe, ma na-enyekwa onye nwere mmụọ nghọta ihe ọmụma. Faic an caibideil |
Ma n'ọgwugwu arọ ufọdu ha gēkekọta onwe-ha; ada eze nke Ndida gābiakute kwa eze Ugwu idozi okwu n'uzọ ziri ezi: ma nwanyi ahu agaghi-anagide ike nke ogwe-aka-ya; nwoke ahu agaghi-eguzogide kwa, ya na ogwe-aka-ya; ma agārara nwanyi ahu nye, ya onwe-ya, na ndi nēme ka ọ bia, na nna muru ya, na nwoke nke nēme ka ọ di ike na mb͕e ahu nile.
N'iwu ndi nāmu anya nyere ka okwu a siteworo, ọ bu kwa n'okwu-ọnu ndi nsọ ka ihe a si puta: ka ndi di ndu we mara na Onye ahu nke kachasi ihe nile elu nāchi achi n'ala-eze nke madu, ọ bu kwa onye ọ bula Ọ chọrọ inye ya ka Ọ nēnye ya, ọ bu kwa onye di ala kari madu nile ka ọ nēme ka o bilie ibu onye-isi-ya.