Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 2:12 - Bible Nso

12 N'ihi nka eze were iwe, iwe-ya we di ọku nke-uku, o we si ka eme ka ndi-amam-ihe nile nke Babilon la n'iyi.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Nke a mere ka eze jupụta nʼoke iwe na ọnụma, o nyere iwu ka e gbuchaa ndị amamihe niile nke Babilọn.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 2:12
14 Iomraidhean Croise  

N'ihi na nkpasu-iwe nēb͕u onye b͕agọro ab͕ago n'uche-ya, Ekworo nēme kwa ka onye nenweghi uche nwua.


N'ihi na ọnuma madu gēkele Gi: I gēji ọnuma nile nke fọduru ke n'úkwù.


Ọnuma eze bu ndi-ozi ọnwu: Ma onye mara ihe gēkpuchi ya.


Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka iwe di ọku nke eze bu; Ma dika igirigi n'elu ihe-ọkukú ka utọ ihe madu nātọ ya di.


Ọb͕ub͕ọ-uja dika nke ọdum ka oké ujọ anātu eze bu: Onye nākpasu Ya iwe nke nērubiga ókè nēmehie megide ndu nke aka ya.


Onye-iwe nākpali ise-okwu, Ọzọ, onye nēnwe ọnuma ri nne nējehie ri nne.


N'ihi nka Daniel bàkuru Ariok, onye eze doro onye-isi ime ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: o jere, ọ bu kwa otú a ka ọ siri ya; Emela ka ndi-amam-ihe nke Babilon la n'iyì: me ka m'bata guzo n'iru eze, ọ bu kwa isi nrọ ahu ka m'gākọrọ eze.


Eze we za, si ndi Kaldea, Okwu nke siworo n'ọnum puta nēguzosi ike: asi na unu emeghi ka m'mara nrọ a na isi-ya, agābọkasi unu, ọ bu kwa ulo nile unu ka agēme ebe-ikpofu-ahihia.


Mb͕e ahu Nebukadneza n'oké iwe na ọnuma-ya siri ka eme Shedrak na Mishak na Abed-nego ka ha bia. Mb͕e ahu ha mere ka ndikom ndia bia n'iru eze.


Mb͕e ahu Nebukadneza juputara n'ọnuma, udi iru-ya we b͕anwe imegide Shedrak na Mishak na Abed-nego: ya mere ọ zara, si ka ha me oké ọku ahu ka ọ di ọku ub͕ò asa kari otú anēmeri ka ọ di ọku.


ọ bu kwa n'ihi idi-uku ahu nke O nyere ya ka ndi nile di iche iche na mba nile na ndi nāsu asusu nile di iche iche nọ nāma jijiji nātu egwu n'iru ya: onye ọ nāchọ ib͕u ọ nēb͕u ya, onye ọ nāchọ idebe ndu ọ nēdebe ya ndu; onye ọ nāchọ ibuli ọ nēbuli ya, onye ọ nāchọ ime ka ọ di ala, ọ nēme ka ọ di ala.


Mb͕e ahu Herod, mb͕e ọ huru na ndi ahu nke mara ihe mere ya ihe-ọchì, ọnuma di ya n'obi nke-uku, o we ziga, b͕uchasia umuaka-ndikom nile di na Betlehem, na n'ókè-ala-ya nile, site na ndi b͕ara arọ abua we rida, dika oge ahu nke ọ jutara nke-ọma n'ọnu ndi ahu mara ihe.


ma Mu onwem si unu, na onye ọ bula nke nēwe iwe megide nwa-nne-ya gēnye onwe-ya n'aka ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa nwa-nne-ya, Raka, gēnye onwe-ya n'aka nnọkọ-ikpé; onye ọ bula nke gāsi kwa, Onye-nzuzù, gēnye onwe-ya n'aka ọku ala-mọ.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan