Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 12:8 - Bible Nso

8 Mu onwem we nu, ma adighm-aghọta: m'we si, Onye-nwem, Gini bu mb͕e ikpe-azu nke ihe ndia?

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Anụrụ m ma aghọtaghị m, nʼihi nke a, a sịrị m, “Biko, Onyenwe m, gịnị ka ihe ndị a ga-apụta?”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 12:8
9 Iomraidhean Croise  

Ma abiawom ime ka i ghọta ihe ahu nke gādakwasi ndi-gi na mb͕e ikpe-azu nke ubọchi ndia: n'ihi na ọhù fọduru nke diri ubọchi ndia.


Otù nime ha we si onye ahu nke yiri uwe ọcha, nke nọ n'elu miri nke osimiri ahu, Rùe ole mb͕e ka ọgwugwu oké ọlu ndia gādi?


M'we nu onye ahu nke yiri uwe ọcha, onye nọ n'elu miri nke osimiri ahu, o we welie aka-nri-ya na aka-ekpe-ya n'elu-igwe, were Onye ahu Nke nādi ndu mb͕e ebighi-ebi, si, na ọ gādiru otù mb͕e akara àkà, na mb͕e abua akara àkà, na nkera mb͕e akara àkà; ma mb͕e agāb͕ajisi aka nke ndi nsọ ahu, ihe nile ndia gāgwusi.


O we si, La, Daniel: n'ihi na ezobewo okwu ndia, kachita kwa ha akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia.


M'we nu otù onye nsọ ka ọ nēkwu, otù onye nsọ we si onye ahu nke nēkwu okwu, Rùe ole mb͕e ka ọhù a gādi, bú nke àjà-nsure-ọku anēsure mb͕e dum, na njehie ahu nke nākpata itọb͕ọrọ-n'efu, inye ma ebe nsọ ma usu-ndi-agha ka azọda ha ukwu?


Ma ndi ahu aghọtaghi ihe ọ bula n'ihe ndia; ezonari-kwa-ra ha okwu a, ha amaghi kwa ihe anēkwu.


Ihe ndia ndi nēso uzọ-Ya amaghi na mbu: kama mb͕e enyereri Jisus otuto, mb͕e ahu ka ha chetara na edereri ihe ndia bayere Ya n'akwukwọ nsọ, na ha me-kwa-ra Ya-ri ihe ndia.


O we si ha, Ọ bughi ihe diri unu ima oge ma-ọbu ubọchi, nke Nnam debere n'ike nke aka Ya.


nēnyocha oge ọ bu ma-ọbu aha oge ọ bu, bú nke Mọ nke Kraist Nke si nime ha nēgosi, mb͕e O buru uzọ nāb͕a àmà bayere ahuhu nke Kraist, na ebube nile nke gēso ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan