Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 11:8 - Bible Nso

8 ọzọ kwa, chi nile ha, ha na arusi nile ha akpuru akpu, tiyere ihe nile ha anāchọsi ike nke-uku nke ọla-ọcha na nke ọla-edo, ka ọ gādọta n'agha bata n'Ijipt; ma ya onwe-ya gēguzo arọ ufọdu ghara imegide eze Ugwu ahu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 Ọ ga-ebukọrọ chi ha niile na arụsị ha niile awụrụ awụ ma ndị atụrụ atụ, na ihe ndị ọzọ dịkarịsịrị ha mkpa dịka efere, ọlaọcha na nke ọlaedo laa Ijipt. O mechaa nke a, ọ ga-akwụsị ịlụso eze ugwu ọgụ afọ ole na ole.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 11:8
17 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a, i lawo n'ezie, n'ihi na agu ulo nna-gi gusiri gi ike, ma n'ìhi gini ka i zuworo chim-hà?


Ha we rapu arusi nile ha n'ebe ahu, Devid na ndikom-ya we chiri ha.


M'gāgabiga kwa n'ala Ijipt n'abali ahu, tib͕u nwa ọ bula eburu uzọ mu n'ala Ijipt, ma madu ma anumanu; ọ bu kwa n'aru chi nile nke Ijipt ka M'gēme ihe nile ekpere n'ikpe: Mu onwem bu Jehova.


ọ gādakwasi kwa ub͕ọ nile nke Tashish, ọ gādakwasi kwa ihe-ile-anya nile anāchọsi ike.


ha etiyewo kwa chi nile ha n'ọku: n'ihi na ọ bughi chi ka ha bu, kama ha bu ọlu aka madu, bú osisi na nkume; ha we me ka ha la n'iyì.


Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bú Chineke nke Israel, siri: Le, M'gaje iji nmehie-ha leta Amon nke No, leta kwa Fero, leta kwa Ijipt, leta kwa chi-ya nile, leta kwa ndi-eze-ya; ọbuná Fero, na ndi nātukwasi ya obi:


Nri anāchọsi ike nke-uku ka m'nērighi, anu na manya-vine abàghi kwa n'ọnum, eteghkwam onwem manu maọli, rue mb͕e ogologo ízù atọ ruzuru.


Ọ gābata kwa n'ala-eze nke eze Ndida, ma ọ gālaghachi n'ala nke aka ya.


Ọ bu ezie na ya onwe-ya nāmi nkpuru n'etiti umu-nne-ya, ma ifufe Iru-anyanwu gābia, bú ifufe Jehova nke nēsi n'ọzara fegota, ọmi-ya ewe ta, isi-iyi-ya gāmikọ kwa: nke ahu gāpunara ya àkù nke ihe ọ bula anāchọsi ike.


N'ihi na Israel ka ọbuná ihe a si puta; onye-ọ̀kà mere ya, ọ bughi kwa Chineke ka ọ bu: n'ihi na umu-irighiri-ihe ka nwa-ehi Sameria gāghọ.


mb͕e ndi Ijipt nēlì ndi Jehova tib͕uru n'etiti ha, bú ndi nile eburu uzọ mu: ọ bu kwa n'aru ndi bu chi-ha ka Jehova mere ihe nile O kpere n'ikpe.


unu gākwatu kwa ebe-ichu-àjà nile ha, tupia ogidi nile ha, sure Asherim-ha n'ọku, b͕utu arusi nile apiri api nke chi nile ha, we me ka aha-ha lapu n'iyì n'ebe ahu.


Ọ si, Ọ bu chim nke m'mere ka unu chiriworo, ha na onye-nchu-àjàm, unu we la, ma gini ka m'nwere ọzọ? gini bu kwa nka nke unu nāsim, Gini nēme gi?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan