Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 11:6 - Bible Nso

6 Ma n'ọgwugwu arọ ufọdu ha gēkekọta onwe-ha; ada eze nke Ndida gābiakute kwa eze Ugwu idozi okwu n'uzọ ziri ezi: ma nwanyi ahu agaghi-anagide ike nke ogwe-aka-ya; nwoke ahu agaghi-eguzogide kwa, ya na ogwe-aka-ya; ma agārara nwanyi ahu nye, ya onwe-ya, na ndi nēme ka ọ bia, na nna muru ya, na nwoke nke nēme ka ọ di ike na mb͕e ahu nile.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Mgbe afọ ole na ole gasịrị, ha ga-ekekọta onwe ha. Ada eze ndịda ga-agakwuru eze ugwu ka ha gbaa ndụ, ma ada eze agaghị ejigide ike ya, eze na ike ya agaghị adịgidekwa. Nʼụbọchị ndị ahụ, a ga-arara ada eze ahụ nye, ya na ndị na-eche ya nche, na nna ya na onye ahụ dịnyeere ya.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 11:6
9 Iomraidhean Croise  

Anēb͕ochi kwa ìhè-ha n'ebe ndi nēmebi iwu nọ, Anānyaji kwa ogwe-aka di elu.


Uzọ-ya nile di ike na mb͕e nile; Ikpé-Gi nile di n'ebe di elu kari èbe anya-ya gēru: Ndi nile nākpab͕u ya, ọ nāpù megide ha na nleli.


Nwa nke madu, ogwe-aka nke Fero, bú eze Ijipt, ka m'b͕ajiworo; ma, le, ekegideghi ya itiye ọgwù-ọgwugwọ di iche iche, ido ákwà-ọkiké ikegide ya, ka o we sie ike ijide mma-agha.


Ma eze Ugwu ahu gēguzobe kwa ìgwè madu ọzọ bara uba kari ìgwè mbu; ọ bu kwa n'ọgwugwu mb͕e ndia, bú nke arọ ndia, ka ọ gābia abia, chiri usu-ndi-agha di uku, chi kwa ọtutu àkù.


Eze Ugwu ahu gābia kwa, wukọta obo-ihe, were otù obodo nke ewusiri ike nke-uku: ogwe-aka nile nke Ndida agaghi-eguzo kwa, ha na ndi ọ rọputara, ọ dighi kwa ike ọ bula ha nwere iguzo.


Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga.


Ma otù onye gēsi n'ome nke nkpọrọgwu nwan yi ahu nile guzo ọtọ n'ọnọdu nwoke ahu, biakute usu-ndi-agha-ya, bata n'ebe siri ike nke eze Ugwu, megide ha, ghọ onye di ike:


N'ihi na, le, Mu onwem gaje ime ka otù onye-ọzùzù-aturu bilie n'ala nka, ọ gaghi-elekọta ndi ebipuru ebipu, ọ gaghi-achọ nke achusara achusa, ọ gaghi-agwọ nke ab͕ajiri ukwu na aka; ọ gaghi-azù nke nēguzo eguzo, ma anu nke aturu mara abuba ka ọ gēri, ukwu nile ha ka ọ gānyajisi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan