M'gēme kwa ka ndi Ijipt adọtara n'agha laghachi, M'gēme kwa ka ha laghachi n'ala Patros, n'ala nputa-n'uwa-ha; ha ewe nọ n'ebe ahu, buru ala-eze di ala.
Ọ gēru kwa, na ab͕uru ọ bula n'etiti ab͕uru nile nke uwa nke nādighi-arigota na Jerusalem ikpọ isi ala nye Eze, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, miri agaghi-ezokwasi ha.