Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 11:40 - Bible Nso

40 Ma na mb͕e nke ọgwugwu ihe ndia eze Ndida gāmalite isọ ya mpi: eze Ugwu ewe dakwasi ya dika oké ifufe, chiri ub͕ọ-ala, chiri kwa ndi-inyinya, chiri kwa ọtutu ub͕ọ; ọ gābà kwa n'ala-ya nile, rubiga ókè dika miri, gabiga.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

40 “Ma nʼoge ikpeazụ, eze ndịda ga-ebuso ya agha, ma eze nke ugwu ga-eji iwe chịkọta ndị agha na-agba ụgbọ agha, ndị na-agba ịnyịnya na ndị agha ji ụgbọ mmiri megide ya. Ọ ga-ebuso ọtụtụ mba agha, kpochapụ ha dịka idee mmiri si ekpochapụ ihe.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 11:40
24 Iomraidhean Croise  

Ibu eboro ọzara nke oké osimiri. Dika oké ifufe nke di nime Negeb nēfebiga, n'ọzara ka o siworo bia, site n'ala di egwu.


ndi àkú-ha nile di nkọ, uta-ha nile ka azọrọ ukwu ikwe ha; aguwo ukwu inyinya-ha nile dika ọmu, na wheel-ha nile dika oké ifufe:


N'ihi na, le, Jehova gēji ọku bia, ub͕ọ-ala-Ya nile gādi kwa ka oké ifufe; iji ọnuma nyeghachi iwe-Ya, na iji ire ọku nyeghachi ibasi-nba-ike-Ya.


Le, dika igwe-oji ka ọ nārigota, ọ bu kwa dika oké ifufe ka ub͕ọ-ala-ya nile di: inyinya-ya nile di garagara kari ugo. Ahuhu gādiri ayi! n'ihi na ebibiwo ayi.


M'gēchighari gi, tiye nb͕a-aka-imi n'àb͕à-gi abua, me ka i puta, gi na usu-ndi-agha-gi nile, ma inyinya ma ndi-inyinya, ndi yiri uwe mab͕uru onwe-ya, ha nile, ọ bu nkpọkọta madu bara uba chiri ọta uku na ọta, ndi nējide mma-agha, ha nile:


I gārigo kwa, dika ikuku siri ike ka i gābia, dika igwe-oji ikpuchi ala ka i gādi, gi onwe-gi, na usu-ndi-agha-gi nile, na ọtutu ndi di iche iche so gi.


Ma umu-ya ndikom gākpali onwe-ha ibu agha, ha gāchikọta kwa ìgwè ọtutu usu-ndi-agha, ọ gābia abia, rubiga ókè dika osimiri, gabiga: ọ gālaghachi kwa, ha gākpali kwa onwe-ha ibu agha rue ebe-ya siri ike.


Ma eze Ndida gēwe iwe di ilu, puta, buso ya agha, bú eze Ugwu ahu: ọ gēguzo kwa oké ìgwè madu, ma agēnye ìgwè madu ahu n'aká-ya.


Ma eze Ugwu ahu gēguzobe kwa ìgwè madu ọzọ bara uba kari ìgwè mbu; ọ bu kwa n'ọgwugwu mb͕e ndia, bú nke arọ ndia, ka ọ gābia abia, chiri usu-ndi-agha di uku, chi kwa ọtutu àkù.


Ma ogwe-aka nile nke nrubiga-ókè ahu ka agēji ruchapu ha n'iru ya, tipia ha; e, onye-ndú nke ọb͕ub͕a-ndu kwa.


Ọ gākpọte kwa ike-ya na obi-ya imegide eze Ndida chiri oké usu-ndi-agha; eze Ndida gākpali kwa onwe-ya ibu agha chiri oké usu-ndi-agha nke di ike nke-uku: ma ọ gaghi-eguzo, n'ihi na ha gēchè èchìchè di iche iche imegide ya.


Ọzọ, ufọdu nime ndi ahu nwere uche gāsu ngọngọ, inucha ha, na ime ka ha di ọcha, na ime ka ha nwue ọcha, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: n'ihi na ọ fọduru idi na mb͕e akara àkà.


Ọ gēmeso kwa ebe nile ewusiri ike nke ebe nile siri ike site n'iye-aka chi ala ọzọ: onye ọ matara gēme ka nsọpuru-ya ba uba; ọ gēme kwa ka ha chia ọra madu, ọ bu kwa ala ka ọ gēkè n'ọnu-ahia.


Ma otù onye gēsi n'ome nke nkpọrọgwu nwan yi ahu nile guzo ọtọ n'ọnọdu nwoke ahu, biakute usu-ndi-agha-ya, bata n'ebe siri ike nke eze Ugwu, megide ha, ghọ onye di ike:


Ma gi onwe-gi, Daniel, zobe okwu ndia, kachita kwa akwukwọ a akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia: ọtutu madu ganējeghari, ihe-ọmuma gāba kwa uba.


O we si, La, Daniel: n'ihi na ezobewo okwu ndia, kachita kwa ha akàrà, rue mb͕e ọgwugwu ihe ndia.


O we bia nso n'ebe m'nēguzo; ma mb͕e ọ biara, m'we tua egwu nke-uku, da kpue irum n'ala: o we sim, Ghọta, gi nwa nke madu; n'ihi na mb͕e nke ọgwugwu ihe nile ka ọhù a diri.


I jiwo nkpa-n'aka-ya dupue ndi-agha-ya isi: Bú ndi nābia dika oké ifufe ifesam: Obi-utọ-ha di ka agāsi na ha gaje iripia onye ewedara n'ala n'ebe-nzuzo.


Ọ bu kwa Jehova ka agāhu n'elu ha, àkú-Ya gāpu kwa dika àmùmà: Onye-nwe-ayi Jehova gāfù kwa opì-ike, je ije n'oké ifufe di iche iche nke Ndida.


Mọ-ozi nke-isi we wusi ọkwa-ya n'elu osimiri uku ahu, bú Yufretis; miri-ya we tasia, ka ewe dozie uzọ ndi-eze ahu ndi si n'ọwūwa-anyanwu bia.


Ọnu-ọgugu usu-ndi-agha ahu, nke bu ndi-inyinya, di ọgu million iri: anurum ọnu-ọgugu-ha.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan