Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 11:22 - Bible Nso

22 Ma ogwe-aka nile nke nrubiga-ókè ahu ka agēji ruchapu ha n'iru ya, tipia ha; e, onye-ndú nke ọb͕ub͕a-ndu kwa.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

22 Mgbe ahụ, ọ ga-achụsasị igwe ndị agha niile, bibiekwa ha na onye ọchịchị nke ọgbụgba ndụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 11:22
11 Iomraidhean Croise  

N'ihi na unu asiwo, Ayi na ọnwu ab͕awo ndu, ayi na ala-mọ ekweritawo kwa nkwa; mb͕e utari nke nērubiga ókè dika miri gāgabiga, ọ gaghi-abiakute ayi; n'ihi na ayi emewo ka okwu-ugha buru ebe-nb͕abà-ayi, ọ bu kwa n'okwu-ugha ka ayi zobeworo onwe-ayi:


Ma umu-ya ndikom gākpali onwe-ha ibu agha, ha gāchikọta kwa ìgwè ọtutu usu-ndi-agha, ọ gābia abia, rubiga ókè dika osimiri, gabiga: ọ gālaghachi kwa, ha gākpali kwa onwe-ha ibu agha rue ebe-ya siri ike.


Ma site na mb͕e madu kekọtara onwe-ha n'ebe ọ nọ ọ gālu ọlu aghughọ: ọ gēji kwa otù mba di nta rigo n'elu, nwe ume.


Ọ gēsite kwa n'ezi uche-ya me ka aghughọ ga nke-ọma n'aka-ya; ọ bu kwa n'obi-ya ka ọ gēme onwe-ya uku; ọ bu kwa na mb͕e udo-ha ka ọ gēbibi ọtutu madu: ọ bu kwa imegide onye-isi nke ndi-isi ka ọ gēguzo; ma agāb͕aji ya nējighi aka.


Ma mb͕e ọgu ízù atọ na abua ahu gasiri agēbipu onye etere manu, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe: ọ bu kwa obodo ahu na ebe nsọ ahu ka ndi nke otù onye-ndú nke gaje ibia gēbibi; ma ọgwugwu-ya gādi na nrubiga-ókè dika nke miri, ọ bu kwa rue ọgwugwu mb͕e ahu ka agha gādi; ihe akara àkà bu itọb͕ọrọ-n'efu di iche iche.


Ala, ọ̀ gaghi-ama jijiji n'ihi nka? onye ọ bula nke bi nime ya, ọ̀ gaghi-eru kwa újú? e, ọ gērujucha dika osimiri Nail; ọ gāmaghari amaghari kwa, tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt.


Ọ bu kwa Onye-nwe-ayi, bú Jehova nke usu nile nke ndi-agha, bu Onye nēmetu ala, o we b͕aze, ndi nile ndi bi nime ya ewe rue újú; ọ gērujucha kwa dika osimiri Nail, we tacha, dika osimiri Nail nke Ijipt;


Ma Ọ gēji miri nke nērubiga ókè nke nērubiga erubiga me ka ọnọdu obodo ahu gwusia, ọ bu kwa ndi-iro-Ya ka Ọ gāchubà n'ọchichiri.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan