Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 11:2 - Bible Nso

2 Ma ub͕u a ezi-okwu ka m'gēgosi gi. Le, ndi-eze atọ ọzọ ganēguzoro Peasia ọtọ; ma nke-anọ gābu ọgaranya nwe àkù uku kari ha nile: ma mb͕e emere ka ọ di ike site n'àkù-ya, ọ gākpọte ndi-ya nile imegide ala-eze Jevan.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

2 “Ugbu a, aga m agwa gị eziokwu. A ga-enwe ndị eze Peshịa atọ ọzọ ndị ga-achịkwa. A ga-enwe eze nke anọ onye ga-aba ụba karịa ndị ọzọ niile. Mgbe ọ ga-adị ike site akụnụba ya, ọ ga-akpalị onye ọbụla imegide eze Griis.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 11:2
17 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu ọlu ulo Chineke nke di na Jerusalem kwusiri; o we kwusi rue arọ nke-abua nke ọbubu-eze nke Daraiọs, bú eze Peasia.


N'ubọchi Ataksakses ka Bishlam na Mitredat na Tabeel na ndi-òtù-ya fọduru degara Ataksakses, bú eze Peasia, akwukwọ; ma edewo odide akwukwọ-ozi ahu n'asusu Siria, asughariwo kwa ya n'asusu Siria.


O rue, n'ubọchi Ahasuerọs, (nka bu Ahasuerọs nke bu eze ọgu ala anāchi achi na asa, site n'India we rue Etiopia:)


Ime ka i mara ikwesi-ntukwasi-obi nke okwu-ọnu nile nke ezi-okwu, Ka i we weghachiri ndi nēzite gi okwu-ọnu nile nke bu ezi-okwu?


N'arọ nke-atọ nke Sairọs, bú eze Peasia, ekpughere Daniel, onye akpọrọ aha-ya Belteshaza, okwu; ọ bu kwa ezi-okwu ka okwu ahu bu, ọbuná obubu-agha uku: o we ghọta okwu ahu, nghọta di-kwa-ra ya n'ọhù ahu.


Ọ gākpọte kwa ike-ya na obi-ya imegide eze Ndida chiri oké usu-ndi-agha; eze Ndida gākpali kwa onwe-ya ibu agha chiri oké usu-ndi-agha nke di ike nke-uku: ma ọ gaghi-eguzo, n'ihi na ha gēchè èchìchè di iche iche imegide ya.


Ma le, anu ọzọ, nke mere ha abua, nke yiri bear, ma n'otù akuku ka emere ya ka o bilie, ọgiriga atọ di kwa n'ọnu-ya n'etiti ezé-ya: ọ bu kwa otú a ka ha nāsi ya, Bilie, rie ọtutu anu.


Nkpi ahu nke nwere aji ri nne bu eze Jevan: ma mpi uku ahu nke di n'etiti anya-ya abua, nke ahu bu eze mbu.


Ma ọhù ahu nke anyasi na ututu nke ekwuworo, ezi-okwu ka ọ bu: ma gi onwe-gi zobe ọhù ahu; n'ihi na ọ diri ọtutu ubọchi di n'iru.


Ahurum ebulu ahu ka ọ nāsọ mpi n'akuku Ọdida-anyanwu, na n'akuku Ugwu, na n'akuku Ndida; ma ọ dighi anu ọ bula nēguzo n'iru ya, ọ dighi kwa onye nānaputa ihe n'aka-ya; ma ọ neme dika ọ tọrọ ya utọ, me onwe-ya uku.


N'ezie Onye-nwe-ayi Jehova agaghi-eme ihe, ma ọ buru na O kpugheghi ìzù nzuzo Ya nye ndi-orù-Ya, bú ndi-amuma-Ya.


Ọ buru na Ọ kpọrọ ndi ahu chi, ndi okwu Chineke biaruru (apughi kwa imebi ihe edere n'akwukwọ nso),


Onye ahu Nke nānọkwasi n'oche-eze ahu we si, Le, anameme ihe nile ka ha di ọhu. O we si, De akwukwọ: n'ihi na okwu ndia kwesiri ntukwasi-obi, buru kwa ezi-okwu.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan