Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 11:17 - Bible Nso

17 Ọ gēdo kwa iru-ya ibia abia n'ike nke ala-eze-ya nile, ndi ziri ezi gēso kwa ya; ọ gēme kwa ihe: ọ bu kwa ada ndinyom ka ọ gēnye ya, ibibi ya; ma ihe ahu agaghi-eguzo, ọ bughi kwa nke ya ka ọ gābu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

17 Ọ ga-ekpebi ịbịa nʼike nke alaeze ya niile, iji mee nke a, ya na eze nke ndịda ga-agba ndụ. Ọ ga-enyekwa ya nwaagbọghọ iji kwatuo alaeze ya, ma ebumnobi ya agaghị eguzo maọbụ baara ya uru.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 11:17
15 Iomraidhean Croise  

Mb͕e ahu Hazael, bú eze Siria, rigoro, buso Gat agha, were ya: Hazael we che iru-ya imegide Jerusalem.


Jehoshafat we tua egwu, che iru-ya ichọ Jehova; o we kpọsa obubu-ọnu na Juda nile.


Mb͕e ahu ndi-irom gālaghachi azu n'ubọchi m'gākpọku Gi: Nka ka m'mara, na Chineke dirim.


Ọtutu èchìchè di n'obi madu; Ma ndum-ọdu Jehova, nke ahu gēguzosi ike.


Fero agaghi-achiri kwa oké usu-ndi-agha-ya na nkpọkọta-madu-ya bara uba me ya ihe ọ bula n'agha ahu, mb͕e ha gāwukọta obo-ihe, wue ulo-agha, ibipu ọtutu madu.


Nwa nke madu, che iru-gi n'ebe umu Amon nọ, bue amuma megida ha:


Gi onwe-gi were kwa n'onwe-gi ite ígwè ighe ihe, tiye ya ka ọ buru mb͕idi ígwè n'etiti gi na obodo ahu: che ya iru, ewe nānọchigide ya n'agha, i gānọchigide kwa ya n'agha. Ihe-iriba-ama ka ọ gāburu ulo Israel.


Ọ bu kwa n'ebe nnọchigide Jerusalem n'agha ahu di ka i gēche iru-gi, ogwe-aka-gi ab͕awo kwa ọtọ; i gēbu kwa amuma megide ya.


Ọ gēchighari kwa iru-ya le ebe nile siri ike nke ala nke aka ya: ma ọ gāsu ngọngọ da, agaghi-ahu kwa ya.


Ma mb͕e ọgu ízù atọ na abua ahu gasiri agēbipu onye etere manu, ọ dighi kwa ihe ọ gēnwe: ọ bu kwa obodo ahu na ebe nsọ ahu ka ndi nke otù onye-ndú nke gaje ibia gēbibi; ma ọgwugwu-ya gādi na nrubiga-ókè dika nke miri, ọ bu kwa rue ọgwugwu mb͕e ahu ka agha gādi; ihe akara àkà bu itọb͕ọrọ-n'efu di iche iche.


Ha nile nābia ime ihe-ike; edosiri iru-ha ike dika ifufe Iru-anyanwu; ha we chikọta ndi adọtara n'agha dika ájá.


Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.


Onye nādighi n'akukum nēmegidem; onye nādighi-esokwam ikpokọta ihe nāchusa achusa.


O rue, mb͕e ubọchi nēzu okè mb͕e agānara Ya n'elu, na Ya onwe-ya che iru-Ya si-ike iga Jerusalem,


Gini kwa ka ayi gēkwu n'ile ihe ndia anya? Ọ buru na Chineke diri ayi, ònye nēmegide ayi?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan