Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Daniel 10:6 - Bible Nso

6 aru-ya di kwa ka beryl, iru-ya di kwa ka àmùmà si di n'ile ya anya, anya-ya abua di kwa ka ọwa nēnwu ọku, ogwe-aka-ya abua na ukwu-ya abua di kwa ka ib͕u-maramara nke ọla akwọchara akwọcha, olu okwu-ya nile di kwa ka olu ìgwè madu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

6 Ahụ ya na-egbukwa maramara dịka nkume beril, ìhè si nʼihu ya dị ka ìhè nke amụma eluigwe. Mkpụrụ anya ya na-enwukwa dịka ire ọkụ. Ụkwụ ya na aka ya na-acha dịka bronz e hichara nke ọma. Okwu si ya nʼọnụ na-ada ụda dịka ụzụ nke ọtụtụ mmadụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Daniel 10:6
18 Iomraidhean Croise  

eriri nke-anọ gābu beryl na onyx na jasper: agētiye ha n'ọla-edo akpara akpà n'ebe-nhiọgide-ha.


Aka-ya abua di ka nb͕a-aka ọla-edo, nke ahiọgideworo beryl nime ha: Afọ-ya di ka ọdu nwupuru enwupu, nke ejiworo sapphire kpuchie ya.


Ihe anọ ahu di ndu nāb͕a ọsọ nālaghachi kwa dika ob͕ub͕u-àmùmà si di n'ile ya anya.


Ka wheel nile ahu na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka ib͕u-maramara nkume beryl: ọ bu kwa otù oyiyi ka ha anọ nwere: ka ha na otú emere ha si di n'ile ha anya, ha di ka agāsi na ọ bu wheel n'etiti wheel.


Mb͕e ha nāga m'we nu olu nkù nile ha, dika olu ọtutu miri, dika olu nke Onye puru ime ihe nile, olu nkpọtu dika olu ọmuma-ulo-ikwū: mb͕e ha guzoro, ha wuda nkù-ha.


Ọzọ, ukwu nile ha bu ukwu guzoziri eguzozi; ọzọ, ọbu-ukwu nke ukwu nile ha di ka ọbu-ukwu nwa-ehi: ha neb͕u kwa maramara dika ib͕u-maramara ọla akwọchara akwọcha.


M'we hu, ma, le, wheel anọ di n'akuku cherubim, otù wheel di n'akuku otù cherub, otù wheel di n'akuku otù cherub: wheel ahu n'ile ha anya di ka ib͕u-maramara nkume beryl si di.


O we me ka m'bia n'ebe ahu, ma le, otù nwoke, ma ele ya anya ọ di ka ọla si di n'ile ya anya, eriri flax di kwa n'aka-ya, ya na amì eji atù ihe; onye ahu nēguzo kwa n'ọnu-uzọ-ama.


M'we hu, ma, le, oyiyi dika ọku si di n'ile ya anya; site n'ihe bu úkwù-Ya n'ile ya anya we ridata, ọ bu ọku: ọzọ, site n'úkwù-Ya we rigo elu, ọ di ka onwunwu-ìhè si di n'ile ya anya, dika ib͕u-maramara amber.


O we nwogha n'iru ha: iru-Ya we nēnwupu dika anyanwu, uwe-Ya nile we nācha ucha dika ìhè.


Oyiyi-ya di ka àmùmà, uwe-ya nācha kwa ucha dika snow:


Mb͕e Ọ nēkpe ekpere, oyiyi iru-Ya we di iche, uwe-Ya we nācha ucha nēb͕u kwa dika àmùma.


M'we hu mọ-ozi ọzọ di ike, ka ọ nēsi n'elu-igwe ridata, nke eb͕okwasiworo ya igwe-oji dika uwe; eke-na-ogwurugwu ahu di kwa n'isi-ya, iru-ya di kwa ka anyanwu, ukwu-ya abua di kwa ka ide ọku;


Anya-Ya abua buru kwa ire ọku, Ọ nēkpu kwa ọtutu okpu-eze n'isi-Ya; O nwe-kwa-ra aha edeworo, nke ọ nādighi onye ọ bula matara, ma-ọbughi Ya onwe-ya.


Dega-kwa-ra mọ-ozi nke nzukọ Kraist di na Taiataira akwukwọ, si, Ihe ndia ka Ọkpara Chineke nēkwu, Onye anya-Ya abua di ka ire ọku, ukwu-Ya abua di kwa ka ọla akwọchapuru ka o b͕upu:


nke-ise bu sardonyx; nke-isi bu sardius; nke-asa bu chrysolite; nke-asatọ bu beryl; nke-iteghete bu topaz; nke-iri bu chrysoprase; nke-iri-na-otù bu jacinth; nke-iri-na-abua bu amethyst.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan