Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 9:9 - Bible Nso

9 Ndi ahu gāma kwa, ha nile, bú Efraim na onye bi na Sameria, ndi nēkwu okwu nime npako na n'oké obi, si,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

9 Ndị ahụ niile ga-amatakwa ya, Ifrem na ndị bi na Sameria ga-amatakwa bụ ndị na-eji nganga na mpako na-ekwu sị,

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 9:9
23 Iomraidhean Croise  

Maikaia we si, Le, i ganāhu n'ubọchi ahu, mb͕e i gābà n'ime-ulo nke di n'ime-ulo izo onwe-gi.


N'iru ntipia ka npako nāga, Ọ bu kwa n'iru isu-ngọngọ ka idi-elu nke mọ madu nāga.


Jehova, ebuliwo aka-Gi, ma ha adighi-ahu: ha gāhu ekworo I nēkworo ndi-Gi, ihere ewe me ha; ọzọ, ọku nke ndi nēmegide Gi gērichapu ha.


Ahuhu gādiri okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ahuhu gādi-kwa-ra okoko-ọhia nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù nke ndi manya-vine nēb͕u!


N'okpuru ukwu ka agāzọda okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè:


Genum nti, unu ndi di ike n'obi, ndi nọpuru ezi omume n'ebe di anya:


N'ihi na M'mara na onye siri ike ka i bu, na ọ bu akwara ígwè ka olu-gi bu, na egedege-iru-gi bu kwa ọla;


Ewe gosi ulo Devid, si, Siria nēzu ike n'elu Efraim. Obi-ya na obi ndi-ya we me nkpatu, dika osisi nile nke oké ọhia si eme nkpatu n'iru ifufe.


Onye-nwe-ayi zigara okwu ba nime Jekob, o we dabà n'Iarael.


Le, obo-ihe ndia atuliri atuli, ha abiaruwo obodo a iwere ya; enyewo kwa obodo a n'aka ndi Kaldea ndi nēbuso ya agha, n'ihi mma-agha, na oké unwu, na ajọ ọria nēfe efe: ihe I kwuworo erèwo kwa; ma, le, I nāhu ya.


M'gēme kwa ihe nile ekpere n'ikpe n'Ijipt: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Ma mb͕e ọ gēme, (le, ọ nēme,) ha gāma kwa na onye-amuma anọwori n'etiti ha.


Eze-ha gēru kwa újú, onye-isi gēyiri itọb͕ọ-n'efu dika uwe, aka nile nke ndi ala ahu gāma kwa jijiji: dika uzọ-ha si di ka M'gēme ha, M'gēji kwa ikpé nile ha kpe ha; ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Anyam agaghi-enwe kwa ebere, M'gaghi-enwe kwa ọmiko: dika uzọ-gi nile si di ka M'gētiyekwasi gi ihe, ihe-árú-gi nile gādi kwa n'etiti gi; unu ewe mara na Mu onwem, bú Jehova, nētib͕u.


Israel echezọwo kwa Onye ahu Nke meworo ya, o we wue ulo uku di iche iche; Juda emewo kwa ka obodo ewusiri ike ba uba: ma M'gēzite ọku n'obodo-ya nile, o gēripia kwa ulo-elu-ya nile.


Ọ bu ezie na Edom nāsi, Etituwo ayi, ma ayi gēwughachi nkpọnkpọ ebe nile; otú a ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, Ndi ahu gēwu, ma Mu onwem gākwatu: agākpọ kwa ha Ókè-ala nmebi-iwu, na Ndi ahu nke Jehova wesaworo oké iwe rue mḅe ebighi-ebi.


Okwu nile unu adiwo ike imegidem, ka Jehova siri. Ma unu nāsi, Gini ka ayi kwuritaworo megide Gi?


N'ihi na, le, ubọchi ahu nābia, ọ nēre dika ite-ọku uku; ndi-nganga nile na onye ọ bula nke nēme ihe-nmebi-iwu gābu kwa ahihia-ọka: ubọchi ahu nke nābia gērechapu ha, ka Jehova nke usu nile nke ndi-agha siri, ọ gaghi-arapu-kwa-ra ha nkpọrọgwu ma-ọbu alaka.


Otú ahu, unu ndi bu nwata, donu onwe-unu n'okpuru ndi-okenye. Ma unu nile were obi di ume-ala ke onwe-unu dika ákwà, ijerita ibe-unu ozi: n'ihi na Chineke nēdo Onwe-ya imegide ndi-npako, ma Ọ nēnye ndi di ume-ala n'obi amara.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan