Ahuhu gādiri okpu-eze npako nke ndi Efraim nāṅubiga manya ókè, ahuhu gādi-kwa-ra okoko-ọhia nākpọnwu akpọnwu nke ima-nma-ya mara nma, nke di n'isi nke ndagwurugwu di urù nke ndi manya-vine nēb͕u!
Ọ dighi ọgwugwu ọ bula iba-uba nke ibu-onye-isi-Ya na udo-Ya gāgwu, n'elu oche-eze Devid, na n'elu ala-eze-ya, ime ka o guzosie ike, na ikwagide ya n'ikpé ziri ezi na n'ezi omume, site n'ub͕u a we rue mb͕e ebighi-ebi. Ekworo Jehova nke usu nile nke ndi-agha gēme nka.
Azaraia nwa Hoshaia, na Johanan nwa Karea, na ndi-nganga nile, we kwue, si Jeremaia, Okwu-ugha ka gi onwe-gi nēkwu: Jehova, bú Chineke-ayi, eziteghi gi isi, Unu abàla n'Ijipt inọ dika ọbìa n'ebe ahu:
Ma otú ọ di, okwum nile na ukpurum nile nke M'nyere ndi-orùm, bú ndi-amuma, n'iwu, hà erughi nna-unu-hà aru? ha we chigharia, si, Dika Jehova nke usu nile nke ndi-agha zubere ime ayi, dika uzọ nile ayi si di, na dika omume nile ayi si di, otú a ka O mesoworo ayi.