Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 9:12 - Bible Nso

12 Siria site n'Iru-anyanwu, na ndi Filistia site n'Ọdida-anyanwu; ha nēwere kwa ọnu nile richapu Israel. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 Ndị Aram sitere nʼọwụwa anyanwụ, na ndị Filistia sitere nʼọdịda anyanwụ ha e werela ọnụ ghere oghe richapụ Izrel. Ma nʼagbanyeghị ihe ndị a niile, iwe ya alaghachibeghị azụ, aka ya ka setịpụkwara esetipụ.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 9:12
25 Iomraidhean Croise  

Na mb͕e ahu ka Rezin, bú eze Siria, weghachiri Ilat nye Siria, chupu ndi-Ju n'Ilot: ndi Siria we ba n'Ilat, biri n'ebe ahu, rue ta.


Ndi Filistia batakwara n'obodo nile nke ebe di ala ala, na nke Negeb nke diri Juda, ha were kwa Bet-shemesh, na Ajalon, na Gedirot, na Soko na umu-obodo-ya, na Timna na umu-obodo-ya, na Gimzo na umu-obodo-ya: ha we biri n'ebe ahu.


N'ihi na ha eripiawo Jekob, Me kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.


Ọ bu nání na ọ makpuworo n'ọnọdu onye-nkpọrọ, ọ bu kwa n'ọnọdu ndi eb͕uru eb͕u ka ha gāda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Ha gēfedakwasi n'ubu ndi Filistia n'Ọdida-anyanwu; ha abua gādi n'otù luta ihe umu Iru-anyanwu n'agha: n'aru Edom na Moab ka ha ganēseti aka-ha; umu Amon ganānu kwa olu-ha.


Ahuhu gādiri ndi ahu ndi nārida n'Ijipt ka ewe yere ha aka, ndi nādabere kwa inyinya, tukwasi obi n'ub͕ọ-ala, n'ihi na ha di ọtutu, tukwasi kwa obi na ndi-inyinya, n'ihi na ha nwere ume nke-uku; ma ha eleghi Onye Nsọ nke Israel anya ọma, ha achọghi kwa Jehova!


N'ihi nka ka iwe Jehova di ọku n'aru ndi-Ya, O we setipu aka-Ya megide ha, tib͕ue ha, ugwu nile we ma jijiji, ozu ndi ahu we di ka ǹsí-anu n'etiti èzí nile. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


N'ihi nka Onye-nwe-ayi agaghi-aṅuri ọṅu n'aru umu-okorọbia-ha, Ọ gaghi-enwe kwa obi-ebere n'aru umu-nb͕ei-ha na ndinyom-ha di-ha nwuru: n'ihi na onye ọ bula nime ha bu onye emeruru emeru na onye nēme ihe ọjọ, ọnu ọ bula nēkwu kwa ihe-nzuzu. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Manase gēmegide Efraim, Efraim gēmegide kwa Manase: ndi ahu abua gēmegide Juda. N'ihe a nile iwe-Ya alaghachighi azu, kama rue ub͕u a ka aka-Ya nēseti eseti.


Wukwasi mba nile ọzọ ọnuma-Gi, bú ndi nāmaghi Gi, wukwasi kwa ab͕uru nile ndi nākpọkughi aha-Gi: n'ihi na ha eripiawo Jekob, e, ha eripiawo ya, me ka ọ gwusia, ha emewo kwa ka ebe-obibi-ya tọb͕ọrọ n'efu.


M'we were ihe-nfucha fucha ha n'ọnu-uzọ-ama nke ala nka; ab͕abawom ha aka umu, emewom ka ndim la n'iyì; ha esighi n'uzọ nile ha lata.


O rue, mb͕e Nebukadreza, bú eze Babilon, rigotara n'ala nka, na ayi siri, Bianu, ka ayi ba na Jerusalem n'ihi usu-ndi-agha nke ndi Kaldea, na n'ihi usu-ndi-agha nke Siria; ayi we biri na Jerusalem.


N'ihi nka kenu ákwà-nkpe n'úkwù-unu, tienu aka n'obi, kwasi kwa ákwá ike: n'ihi na iwe di ọku nke Jehova esighi n'aru ayi laghachi.


Ma, le, esetiwom akam imegide gi, M'we bilata òkè nri-gi, rara gi nye n'aka ọchichọ nkpuru-obi ndi nākpọ gi asì, bú umu-ndinyom ndi Filistia, ndi ihere uzọ ajọ nzube gi mere.


M'gēseti kwa akam n'aru ha, me ka ala-ha ghọ ebe tọb͕ọrọ n'efu na ihe-iju-anya, site n'ọzara rue Dibla, n'ebe-obibi nile ha: ha ewe mara na Mu onwem bu Jehova.


Npako Israel azawo kwa okwu n'iru ya: ma ha alaghachikuteghi Jehova, bú Chineke-ha, ha achọtaghi kwa Ya, n'ihe a nile.


Ezitewom ajọ ọria nēfe efe n'etiti unu n'uzọ o si eme n'Ijipt: eb͕uwom umu-okorọbia-unu na mma-agha, ha na inyinya nile unu adọtara n'agha; M'we me ka ísì ọjọ nke ọmuma-ulo-ikwū-unu rigota ọbuná n'imi-unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Akwatuwom ufọdu n'etiti unu, dika mb͕e Chineke kwaturu Sọdọm na Gọmọra, unu we di ka ọlọkọ-ọku alọputara n'orire-ọku: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Mu onwem kwa, enyewom unu ezé nwuru enwu n'obodo nile unu, na ukọ nri n'ebe nile unu: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu jehova puta.


Obodo abua ma-ọbu atọ ewe ṅagharia rue otù obodo iṅu miri, ma ha adighi-aṅuju afọ: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


Ejirim nchakpọ, ji kwa ọmuma-ebù, tib͕ue unu: ka ha rà, bú ubi-unu ab͕ara ogige, na ubi-vine-unu, na osisi fig unu, na osisi olive unu, palmer-worm nērichapu ha: ma unu alaghachikuteghm; ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta.


na ndi si n'iso Jehova laghachi azu; na ndi nāchọghi Jehova, nājughi kwa ase Ya.


Ọ geghi nti olu Chineke; ọ naraghi idọ-aka-na-nti; Jehova ka ọ nātukwasighi obi; Chineke-ya ka ọ nābiakuteghi nso.


Iwem gādi kwa ọku megide ha n'ubọchi ahu, M'gārapu kwa ha, zopu irum n'aru ha, ha gābu kwa ihe agēri eri, ọtutu ihe ọjọ na ahuhu gāchọta kwa ha; ha gāsi kwa n'ubọchi ahu, Ọ̀ bughi n'ihi na Chineke-ayi anọghi n'etiti ayi ka ihe ọjọ ndia chọtaworo ayi?


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan