Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 8:8 - Bible Nso

8 ọ gēruru kwa ba na Juda; ọ gēruchi, gabiga kwa; ọbuná n'olu ka ọ gēru; nsetipu nkù-ya abua gābu kwa ihe juputara obosara ala-gi, Immanuel.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

8 wụsịakwa nʼala Juda niile. Ọ ga-erikpu ala Juda niile, ọ ga-agabiga, kpuchiekwa ọ bụladị nʼolu ka ọ ga-eru. Nku ya ga-agbasa kpuchie obosara niile nke ala gị, O Ịmanụel.”

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 8:8
22 Iomraidhean Croise  

Ya ka Shalmanesa, bú eze Asiria, rigoro imegide; Hoshea we ghọ orù-ya, butere ya onyinye-inata-iruọma.


O we were obodo nile ewusiri ike nke Juda nwere, we biarue Jerusalem.


Imegide mba emeruru emeru ka M'nēziga ya, bayere ndi nke nrubiga-ókè-iwem ka M'nēnye kwa ya iwu, ikwata ihe-nkwata n'agha, na iluta ihe-nluta n'agha, na ido ha ihe-nzọtọ dika apiti nke èzí.


iku-ume-Ya di kwa ka iyi nērubiga ókè, rue olu ka ọ nēkewa, iji yọ nke ihe-efu yọcha mba nile: bridle nke nēdufu edufu gādi kwa n'àb͕à ndi di iche iche.


Mb͕e i nāgabiga nime miri, gi ka M'gānọyere; mb͕e i nāgabiga nime osimiri, ha agaghi-erùchapu gi: mb͕e i nēje ije n'ọku, ọku agaghi-aru gi; ire-ọku agaghi-ere kwa gi ọku.


N'ihi nka Onye-nwe-ayi onwe-ya gēnye unu ihe-iriba-ama; le, nwa-ab͕ọghọ ahu di ime, ọ gaje kwa imu nwa-nwoke, ọ gākpọ kwa aha-ya Immanuel.


Jehova gēme ka ubọchi biakwasi n'aru gi na n'aru ndi-gi, na n'aru ulo nna-gi, bú ubọchi nke nābiaghi site n'ubọchi Efraim wezugara onwe-ya n'aru Juda; ọbuná eze Asiria.


Duritanu onwe-unu ọdu, ma agēmebi ya; kwuenu okwu, ma ọ gaghi-eguzosi ike: n'ihi na Chineke nọyere ayi.


Otú a ka Jehova siri: Le, miri nēsi n'Ugwu erú, ha gāghọ kwa miri-iyi nērubiga ókè, ha gērusa kwa ala na ùjú-ya, na obodo na ndi bi nime ya: madu ewe tie nkpu, ndi nile bi n'ala ahu gākwasi kwa ákwá ike.


N'ihi na otú a ka Jehova siri: Le, dika ugo ka ọ gēfesi ike, b͕asa nkù-ya abua rue Moab.


Oké osimiri erukpuwo Babilon: ejiwo nkpọtu nmali-miri-ya nile kpuchie ya.


si, Otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Ugo uku nke nkù-ya abua di uku, ábúbà-ya di kwa ogologo, nke juputara n'uruma, nke turu agwa, biaruru Lebanon, were ọnu-ọnu cedar:


N'ihi na otú a ka Onye-nwe-ayi Jehova siri: Mb͕e M'gēme gi nkpọnkpọ obodo, dika obodo nile nke madu nēbighi; mb͕e M'gēme ka ob͕u-miri rigokwasi gi, mb͕e ọtutu miri gēkpuchi gi;


Ma umu-ya ndikom gākpali onwe-ha ibu agha, ha gāchikọta kwa ìgwè ọtutu usu-ndi-agha, ọ gābia abia, rubiga ókè dika osimiri, gabiga: ọ gālaghachi kwa, ha gākpali kwa onwe-ha ibu agha rue ebe-ya siri ike.


N'ihi na ihe nādighi ngwọta ka ntiputa-ọnyá nile bu: n'ihi na ọ biaruwo Juda; o rutewo ọnu-uzọ-ama ndim, rue Jerusalem.


Onye a gābu kwa udo: mb͕e Asiria gābata n'ala-ayi, mb͕e ọ gāzọ kwa ukwu n'ulo-elu nile ayi, ayi gēme kwa ka ndi-ọzùzù-aturu asa na ndi-isi madu asatọ bilie imegide ya.


Le, nwa-ab͕ọghọ ahu nāmaghi nwoke gādi ime, ọ gāmuta kwa Nwa-nwoke, Ha gākpọ kwa aha-Ya Immanuel; nke bu, ma asugharia ya, Chineke nọyere ayi.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan