Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 8:20 - Bible Nso

20 Ayi diri iwu, di-kwa-ra ihe-àmà! ọ buru na ha adighi-ekwu dika okwu a si di, n'ezie ọ dighi chi-ọbubọ diri ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

20 Lezienụ okwu ntụziaka na nke ịdọ aka na ntị Chineke anya. Ọ bụrụ na ozi ha dị iche na nke a, o gosiri na ha enweghị ìhè maọbụ eziokwu ọbụla nʼime ha.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 8:20
29 Iomraidhean Croise  

Ma ub͕u a ka ayi na Chineke-ayi b͕a ndu na ayi gēme ka ndinyom ahu nile na umu amuru site na ha pua, dika ndumọdu si di nke Onye-nwe-ayi, na nke ndi nāma jijiji n'ihe nile nke Chineke-ayi nyere n'iwu; dika iwu-Ya si di ka agēme kwa ya.


Nkpughepu okwu-Gi nile nēnye ìhè; Ọ nēmeka ndi nēnweghi uche ghọta ihe.


O we me ka otù ihe-àmà guzosie ike nime Jekob, O do-kwa-ra iwu n'Israel, Nke O nyere nna-ayi-hà n'iwu, Ime ka umu-ha mara ha:


Ma okporo-uzọ ndi ezi omume di ka ìhè nēnwu enwu, Nke nāmu aga n'iru n'iru rue mb͕e chi bọchara.


Nurunu okwu Jehova, unu ndi-ikpe Sọdọm; ṅanu nti n'iwu Chineke-ayi, unu ndi Gọmọra.


Kechie ihe-àmà, kà iwu akàrà n'etiti ndi-nmutam.


ala ka ha gēlegide kwa anya, ma, le, ahuhu na ọchichiri, bú nb͕achi nke nkpà; ọ bu kwa oké ọchichiri ka aganēnupu ha bà.


Otú a ka Jehova siri, Guzonu n'uzọ nile, hu, ju-kwa-nu ajuju bayere okoporo-uzọ nile nke mb͕e ebighi-ebi gara aga, si, Òle ebe ezi uzọ di kwa? je-kwa-nu ije nime ya, we chọtara nkpuru-obi-unu izu-ike. Ha we si, Ayi agaghi-eje ije nime ya.


Ihere emewo ndi mara ihe, ha atuwo ujọ, ewe jide ha: le, okwu Jehova ka ha juworo; ọ̀ bu kwa aha amam-ihe gini ka ha nwere?


Ka ayi mara kwa, ka ayi b͕aso imara Jehova; dika chi-ọbubọ, otú a ka ọpupu-Ya guzosiworo ike: Ọ gābiakute kwa ayi dika oké miri-ozuzo, dika miri-ozuzo ikpe-azu nke nēzosa ala.


N'ihi nka ka abali gādiri unu, unu ewe ghara ihu ọhù; ọchichiri gāb͕a-kwa-ra unu, unu ewe ghara iju ase; anyanwu gādakpute kwa ndi-amuma ahu, ubọchi ewe ji nji n'elu ha.


Ma unu ndi nātu egwu aham ka anyanwu nke ezi emume gāwara, ọgwugwọ di kwa na nkù; unu gāpu kwa, wulie elu dika umu-ehi nke ulo ebe anēme ka anu ma abuba.


Ma Jisus zara, si ha, Unu nēhie uzọ, ebe unu amataghi ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, ma-ọbu ike Chineke.


Ma ọ buru na anya-gi jọrọ njọ, aru-gi dum gējuputa n'ọchichiri. Ya mere, ọ buru na ìhè nke di nime gi bu ọchichiri, le ka ọchichiri ahu si di oké ibù!


O we za, si ha, Gini ka Moses nyere unu n'iwu?


O we si ya, Gini ka edeworo n'akwukwọ iwu? ì si aṅa agu ya?


Unu nēnyocha ihe edeworo n'akwukwọ nsọ, n'ihi na unu onwe-unu nēchè na unu nēnwe ndu ebighi-ebi nime ha; ha onwe-ha bu kwa ihe nāb͕aram àmà;


Ma ndia ka ndi bi na Tesalọnaika nma n'obi, ebe ha were obi di ọku nile nara okwu ahu nke-ọma, nēnyocha ihe nile edeworo n'akwukwọ nsọ kwa-ubọchi, ma ihe ndia di otú a.


Mb͕e ha nēkwu na ha bu ndi mara ihe, ha we ghọ ndi-nzuzu,


Eme-kwa-ra ka okwu amuma ahu guzosiere ayi ike kari; nke unu nēme nke-ọma n'iṅa nti ya, dika oriọna mb͕e ọ nēnwu n'ebe b͕ara ọchichiri, rue mb͕e chi gābọ, kpakpando chi-ọbubọ we tibe n'obi-unu:


N'ihi na onye ahu ihe ndia nādighi ya nso bu onye kpuru ìsì, onye nāhu inyoghi-inyoghi, ebe ọ chezọrọ nsachapu nke nmehie ochie ya nile.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan