Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 8:13 - Bible Nso

13 Jehova nke usu nile nke ndi-agha, Ya ka unu gēdo nsọ; Ya onwe-ya buru kwa ihe unu nātu egwu, Ya onwe-ya buru kwa ihe nēme ka unu ma jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

13 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, ya ka unu ga-edo nsọ. Ya bụ onye unu kwesiri ịtụ ụjọ. Ya bụ onye unu ga-atụ egwu ma jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 8:13
18 Iomraidhean Croise  

Chineke nke Abraham, na Chineke nke Nehoa, bú Chineke nke nna-ha, kpe ikpe n'etiti ayi. Jekob we were Oké Egwù nke nna-ya Aisak ṅua iyi.


Gi onwe-gi, Onye anātu egwu ka I bu: Ọzọ, ònye gēguzo n'iru Gi site na mb͕e I were iwe?


Moses we si ndi Israel, Unu atula egwu: n'ihi na ọ bu inwa unu ka Chineke biaworo, ya na ka egwù-Ya we di n'iru unu, ka unu we ghara imehie.


Ma mb͕e ọ nāhu umu-ya, bú ọlu akam abua, n'etiti ya, ha gēdo aham nsọ; e, ha gēdo Onye Nsọ nke Jekob nsọ, ọ bu kwa n'iru Chineke nke Israel ka ha gāma jijiji.


ma Jehova nke usu nile nke ndi-agha di elu n'ikpé, edowo kwa Chineke, bú Onye Nsọ ahu, nsọ n'ezi omume.


i gārigo kwa imegide ndim, bú Israel, dika igwe-oji ikpuchi ala; n'ikpe-azu nke ubọchi ndia ka ọ gēru, na M'gēme ka i biakwasi alam, ka mba nile we maram, mb͕e agēdowomri nsọ nime gi n'anya-ha, gi Gog.


Moses we si Eron, Nka bu ihe Jehova kwuru, si, N'aru ndi nābiarum nso ka agēdom nsọ, ọ bu kwa n'iru ndim nile ka agāsọpurum. Eron we b͕a nkiti.


Unu eme-kwa-la ka aha nsọm ghara idi nsọ; ma agēdom nsọ n'etiti umu Israel: Mu onwem bu Jehova nēdo unu nsọ,


Ọgbugha-ndum diyere ya, bú ndu na udo; M'we nye ya ha dika ihe-egwu, o we tua egwum, ọ bu kwa aham ka ya onwe-ya turu ujọ ya.


n'ihi na unu nupuru isi n'okwu-ọnum n'ọzara Zin, n'ise-okwu ahu nke nzukọ Israel, bú nke M'gwara unu me, idom nsọ na miri ahu n'anya-ha (Miri ahu bu miri Meriba Kedesh n'ọzara Zin.)


Unu atu-kwa-la egwu ndi nēb͕u aru, ma ha apughi ib͕u nkpuru-obi: kama nātunu egwu Onye ahu Nke puru ila nkpuru-obi na aru n'iyì n'ọku ala-mọ.


Ma M'gēgosi unu Onye unu gātu egwu: tuanu egwu Onye ahu, Nke nwere ike itubà n'ọku ala-mọ mb͕e O b͕usiri; e, asim unu, Tuanu egwu Onye ahu.


o jighi kwa ekweghi-ekwe nwe obi abua n'ebe nkwa Chineke di, kama ejiri okwukwe-ya me ka o nwe ike, ọ nēnye kwa Chineke otuto,


I gēri kwa ihe n'iru Jehova, bú Chineke-gi, n'ebe ahu nke Ọ gārọputa ime ka aha-Ya biri n'ebe ahu, bú otù uzọ n'uzọ iri nke ọka-gi, na nke manya-vine ọhu gi, na nke manu-gi, na umu eburu uzọ mu nke ìgwè ehi-gi na nke ìgwè ewu na aturu-gi; ka i we muta itu egwu Jehova, bú Chineke-gi, ubọchi-gi nile.


Ònye nāgaghi-atu egwu, Onye-nwe-ayi, to kwa aha-Gi? n'ihi na nání Gi di ọcha n'obi; n'ihi na mba nile gābia kpọ kwa isi ala n'iru Gi; n'ihi na emere ka ezi omume-Gi nile puta ìhè.


O we chiri ehi abua, bọkasia ha, zisa ha n'ókè-ala nile nke Israel n'aka ndi-ozi, si, Onye ọ bula nke nāputaghi iso Sọl na iso Samuel n'azu, otú a ka agēme ehi-ya. Oké egwu nke Jehova we dakwasi ndi Israel, ha we puta dika otù nwoke.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan