Biblia Todo Logo
Bìoball air-loidhne

- Sanasan -




Aịzaya 8:12 - Bible Nso

12 Unu agaghi-asi, Nkekọta imegide eze, n'ihe nile nke ndi nka nāsi, Ọ bu nkekọta imegide eze; unu agaghi-atu kwa egwu ihe ha nātu egwu ya, unu agaghi-ama-kwa-ra ya jijiji.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac

Baịbụlụ Nsọ nʼIgbo Ndị Ugbu a

12 “Adịnyerela ha nʼihe niile ha na-ezube ime na nzuzo megide ọchịchị; ka ihe ha na-atụ egwu hapụ ịbụ ihe ga-eme ka ị tụọ egwu.

Faic an caibideil Dèan lethbhreac




Aịzaya 8:12
13 Iomraidhean Croise  

kama Jehova, bú Chineke-unu, ka unu gātu egwu; Ya onwe-ya gānaputa kwa unu n'aka ndi-iro-unu nile.


N'ebe ahu ka ha turu oké egwu, n'ebe oké egwu nādigh: N'ihi na Chineke esesawo ọkpukpu nke onye nāma ulo-ikwū-ya imegide gi; I mewo ka ihere me ha, n'ihi na Chineke ajuwo ha.


Ahuhu gādiri umu nēwezuga onwe-ha, ọ bu ihe si n'ọnu Jehova puta, ndi nēme ihe ezubeworo, ma o siteghi n'akam; ndi ji ihe-nkpuchi ekpuchi ihe, ma ọ bughi nke Mọm, ka ha we were nmehie tukwasi na nmehie:


Ma mb͕e ọ bula unu gānu okwu agha di iche iche na aghara di iche iche, unu atula ujọ: n'ihi na ihe ndia aghaghi ibu uzọ puta; ma ọgwugwu ihe nile adighi-eru ngwa ngwa.


Ènyeghm i iwu? Di ike, nwe kwa ume; amala jijiji, atu-kwa-la ujọ: n'ihi na Jehova, bú Chineke-gi, nọyere gi n'ebe ọ bula i nēje.


Joshua we si na Gilgal rigo, ya onwe-ya, na ndi-agha nile tiyere ya, na ndi-dike nile, bú ndi-dìnkpà.


Lean sinn:

Sanasan


Sanasan